Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

“Ka Ihe Ndị Dị Ugbu A Ju Unu Afọ”

“Ka Ihe Ndị Dị Ugbu A Ju Unu Afọ”

Ọ bụrụ na anyị dara ogbenye, e nwere ike ịnwa anyị ọnwụnwa ka anyị mee ihe ga-emebi mmekọrịta anyị na Jehova. Anyị nwere ike inweta ohere ga-eme ka anyị na-akpata ego buru ibu, mana ya emee ka o sikwuoro anyị ike ịna-efe Jehova. Ichebara Ndị Hibru 13:5 echiche ga-enyere anyị aka.

“Ka otú unu si ebi ndụ gosi na unu ahụghị ego n’anya”

  • Kpee ekpere ma chebara otú i si ele ego anya echiche. Cheekwa banyere ihe ụmụ gị na-amụta n’aka gị.​—g 11/15 6.

“Ka ihe ndị dị ugbu a ju unu afọ”

  • Gbalịa mata ihe ndị dị gị mkpa n’eziokwu.​—w16.07 7 ¶1-2.

“E nweghị ihe ga-eme ka m hapụ gị, e nweghịkwa ihe ga-eme ka m gbakụta gị azụ.”

  • Tụkwasị Jehova obi na ọ ga-enyere gị aka inweta ihe ndị dị gị mkpa ma ị nọgide na-ebute Alaeze ya ụzọ.​—w14 4/15 21 ¶17.

LEENỤ VIDIO BỤ́ OTÚ ỤMỤNNA ANYỊ SI NA-ENWE UDO N’AGBANYEGHỊ IHE ISI IKE, ZAAKWANỤ AJỤJỤ A:

Gịnị ka ị mụtara n’akụkọ Miguel Novoa?