Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

‘Wepụta Ihe Ị Ga-enye’

‘Wepụta Ihe Ị Ga-enye’

Anyị ekwesịghị ịna-enye onyinye si anyị n’obi naanị mgbe ọ dapụtara. Kama, anyị kwesịrị ‘ịna-ewepụta ihe anyị ga-enye ewepụta,’ otú Pọl onyeozi kwuru ka anyị na-eme. (1 Kọr. 16:2) Anyị soro ndụmọdụ a si n’ike mmụọ nsọ, anyị ga na-akwado ezigbo ofufe, na-enwekwa ọṅụ. Ọ bụrụgodị na anyị echee na onyinye anyị na-enye enweghị otú ọ hà, obi na-atọ Jehova ụtọ maka na anyị chọrọ ịna-enye ya ihe ndị kacha mma anyị nwere.​—Ilu 3:9.

LEENỤ VIDIO BỤ́ I MEELA MAKA IWEPỤTA IHE Ị GA-ENYE, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Olee uru ndị anyị na-erite ma anyị hazie otú anyị ga na-esi enye onyinye ahazi?

  • Olee otú ụfọdụ ndị si họrọ ‘ịna-ewepụta ihe ha ga-enye’?