Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Disemba 16-22

ABỤ ỌMA 119:57-120

Disemba 16-22

Abụ nke 129 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

1. Otú E Si Edi Ahụhụ

(Nkeji 10)

Nọgide na-agụ Okwu Chineke ma na-amụ ya (Ọma 119:61; w06 6/15 20 ¶2; w00 12/1 14 ¶3)

Kwe ka ọnwụnwa bịaara gị nụchaa gị (Ọma 119:71; w06 9/1 14 ¶4)

Rịọ Jehova ka ọ kasie gị obi (Ọma 119:76; w17.07 13 ¶3, 5)

JỤỌ ONWE GỊ, SỊ: ‘Olee ụzọ dị iche iche Jehova sirila nyere m aka idi ahụhụ?’

2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke

(Nkeji 10)

  • Ọma 119:96​—Gịnị ka ọ ga-abụ na amaokwu a pụtara? (w06 9/1 14 ¶5)

  • Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?

3. Ọgụgụ Baịbụl

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA

4. Ịmalite Mkparịta Ụka

(Nkeji 3) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Gosi onye nwe ụlọ ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet, nyekwa ya kaadị jw.org. (lmd isi nke 2 nọmba nke 5)

5. N’Oge Ọzọ

(Nkeji 4) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. Gwa onye ahụ ka ọ bịa gere okwu ihu ọha ọzọ a ga-ekwu. Gosi ya vidio bụ́ Gịnị Ka A Na-eme n’Ụlọ Nzukọ Alaeze? (lmd isi nke 8 nọmba nke 3)

6. Ịkọwa Ihe Ndị I Kweere

(Nkeji 5) Ihe Ngosi. ijwbq 157​—Isiokwu: Gịnị ka Baịbụl Kwuru Banyere Ọdachi Ndị Na-emere Onwe Ha? (lmd isi nke 3 nọmba nke 3)

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Abụ nke 128

7. Jehova Na-enyere Anyị Aka Ịtachi Obi

(Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.

A sị na Onye Kraịst na-atachi obi, ọ pụtara na onye ahụ na-edili ihe isi ike ma ọ bụ nsogbu. Ọ pụtara na onye ahụ na-akwụrụ chịm, na-ele nsogbu bịaara ya anya otú kwesịrị ekwesị, na-enwekwa olileanya na nsogbu ahụ ga-emecha bie. Ọ bụrụ na anyị ana-atachi obi, anyị agaghị ‘ala azụ’ ma ọ bụ selata aka n’ofufe anyị na-efe Jehova ma ihe sie ike. (Hib. 10:36-39) Jehova chọsiri ike inyere anyị aka ịtachi obi.​—Hib. 13:6.

Dee otú Jehova si enyere anyị aka ịtachi obi n’okpuru amaokwu nke ọ bụla dị ebe a.

Kpọnye VIDIO Bụ́ Na-ekpesi Ekpere Ike Maka Ndị Na-edi Ọnwụnwa. Jụzie ụmụnna ajụjụ ndị a:

  • Olee otú anyị ga-esi jiri jw.org na-amata otú ihe si dịrị ụmụnna anyị ndị a na-akpagbu?

  • Olee otú ndị nne na nna ga-esi kụziere ụmụ ha ịna-echeta ndị ọzọ n’ekpere, oleekwa uru ọ na-aba?

  • Gịnị mere o ji dị mkpa ịrịọ Jehova ka o nyere ụmụnna anyị aka ịtachi obi?

  • Olee otú icheta ndị ọzọ n’ekpere ga-esi nyere anyị aka idi ọnwụnwa nke anyị?

8. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ

Okwu Mmechi (Nkeji 3) | Abụ nke 32 na Ekpere