Disemba 23-29
ABỤ ỌMA 119:121-176
Abụ nke 31 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)
1. Otú Anyị Ga-esi Ghara Ịna-akpatara Onwe Anyị Obi Mgbawa
(Nkeji 10)
Jiri iwu Chineke kpọrọ ihe (Ọma 119:127; w18.06 17 ¶5-6)
Kpọọ omume ọjọọ asị (Ọma 119:128; w93 4/15 17 ¶12)
Na-ege Jehova ntị, emejọkwala ihe otú “ndị na-amaghị ihe” na-eme (Ọma 119:130, 133; Ilu 22:3)
JỤỌ ONWE GỊ, SỊ: ‘Olee ihe ndị m kwesịrị imezi ma a bịa n’iji iwu Chineke kpọrọ ihe ma ọ bụ n’ịkpọ omume ọjọọ asị?’
2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
(Nkeji 10)
-
Ọma 119:160—N’ihi ihe e kwuru n’amaokwu a, olee ihe obi kwesịrị isi anyị ike na ya? (w23.01 2 ¶2)
-
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?
3. Ọgụgụ Baịbụl
(Nkeji 4) Ọma 119:121-152 (th ihe ọmụmụ nke 2)
4. Ịmalite Mkparịta Ụka
(Nkeji 3) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. (lmd isi nke 1 nọmba nke 5)
5. N’Oge Ọzọ
(Nkeji 4) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Gosi mmadụ otú ọ ga-esi chọta ihe ga-amasị ya na jw.org. (lmd isi nke 8 nọmba nke 3)
6. Ime Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs
(Nkeji 5) Gị na onye ị na-amụrụ Baịbụl, nke na-anaghị abịachi ọmụmụ ihe anya, kwurịta okwu. (lmd isi nke 12 nọmba nke 4)
Abụ nke 121
7. Ekwela Ka Ego Mee Ka Ahụ́ Niile Na-afụ Gị Ụfụ
(Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.
Ndị hụrụ ego n’anya emeela “ka ahụ́ niile na-afụ ha ụfụ ka ndị mara onwe ha mma aghara aghara.” (1 Tim. 6:9, 10) N’okpuru ebe a, e dere ụfọdụ nsogbu ga-abịara anyị ma anyị hụ ego n’anya ma kwe ka ọ bụrụ ihe kacha mkpa ná ndụ anyị.
-
Anyị na Jehova agaghị adị n’ezigbo mma.—Mat. 6:24
-
O nweghị mgbe akụnụba ga-eju anyị afọ.—Ekli. 5:10
-
Ọ ga-esikwuru anyị ike izere omume rụrụ arụ, ma ịgha ụgha ma izu ohi ma ịghọ aghụghọ. (Ilu 28:20) Imekwanụ ihe ndị ahụ ga-eme ka obi anyị na-ama anyị ikpe, mee ka anyị nwee aha ọjọọ, meekwa ka anyị na Chineke ghara ịdị ná mma
Gụọnụ Ndị Hibru 13:5. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
-
Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele ego anya ka anyị ghara ịkpatara onwe anyị obi mgbawa, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?
Ọ bụrụgodị na anyị ahụghị ego n’anya, anyị ga-akpatara onwe anyị obi mgbawa ma ọ bụrụ na anyị anaghị akpachara anya n’otú anyị si emefu ego.
Kpọnye KATUUN A NA-ESE NA BỌỌDỤ Bụ́ Ihe Ndị Ị Ga-eme Ka Ị Ghara Ịna-emefusị Ego Gị. Jụzie ụmụnna ajụjụ ndị a:
-
Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-eme atụmatụ otú anyị ga-esi emefu ego tupu anyị emefuo ya, oleekwa otú anyị ga-esi eme ya?
-
Gịnị mere o ji dị mma ịna-echekwatụ ego?
-
Gịnị mere na ọ dịghị mma ikoro ụgwọ aghara aghara?
8. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ
(Nkeji 30) rr nkebi nke 5, isi nke 19 ¶1-6, vidio kọwara isiokwu a na-amụ, igbe 19A