Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Disemba 30, 2024–Jenụwarị 5, 2025

ABỤ ỌMA 120-126

Disemba 30, 2024–Jenụwarị 5, 2025

Abụ nke 144 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

Ebe ndị Izrel si Babịlọn lọta ji ọṅụ na-ewe ihe ubi maka na Jehova gọziri mbọ ha gbara

1. Ha Ji Anya Mmiri Ghaa Mkpụrụ, ma Jiri Ọṅụ Ghọrọ Mkpụrụ

(Nkeji 10)

Obi dị ndị Izrel ụtọ mgbe a tọhapụrụ ha na Babịlọn ka ha gaa maliteghachi ife Chineke ezigbo ofufe (Ọma 126:1-3)

O nwere ike ịbụ na ndị ahụ lọghachitere Judia bere ákwá n’ihi nnukwu ọrụ dịịrị ha ịrụ (Ọma 126:5; w04 6/1 16 ¶10)

Ha nọgidesiri ike na-arụ ọrụ, Jehova gọzikwara ha (Ọma 126:6; w21.11 24 ¶17; w01 7/15 18-19 ¶13-14; lee ihe e sere n’ihu akwụkwọ a)

AJỤJỤ Ị GA-ECHEBARA ECHICHE: A napụtachaa anyị n’ụwa ochie a n’agha Amagedọn, olee ihe ndị nwere ike ịbụrụ anyị nsogbu mgbe anyị na-arụzigharị ụwa ka ọ bụrụ paradaịs? Olee ngọzi ndị anyị ga-enweta?

2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke

(Nkeji 10)

  • Ọma 124:2-5​—Ànyị kwesịrị ịtụ anya ka Jehova chebe anyị ka ihe ọ bụla ghara ime anyị otú o chebere mba Izrel? (cl 73 ¶15)

  • Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?

3. Ọgụgụ Baịbụl

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA

4. Ịmalite Mkparịta Ụka

(Nkeji 3) IKWUSA OZI ỌMA N’EBE NDỊ MMADỤ NA-ANỌKARỊ. (lmd isi nke 3 nọmba nke 5)

5. N’Oge Ọzọ

(Nkeji 4) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. N’oge gara aga ị gara na nke ya, o kwuru na ya ekwetaghị na e kwesịrị ịtụkwasị Baịbụl obi. (lmd isi nke 9 nọmba nke 5)

6. Ime Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Abụ nke 155

7. Ka Nkwa Ndị Chineke Kwere Na-eme Gị Obi Ụtọ

(Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.

Jehova mezuru nkwa o kwere ndị ya a dọọrọ n’agha laa Babịlọn. Ọ napụtara ha ma gbaghara ha mmehie ndị ha mere n’oge gara aga. (Aịza. 33:24) O doro anya na o chebere ha na anụmanụ ha ka ọdụm na anụ ọhịa ndị ọzọ mụbara n’ala ha n’oge ahụ a dọọrọ ha n’agha ghara iji ha mere anụ oriri. (Aịza. 65:25) Ha nweziri ike ibi n’ụlọ nke ha, na-erikwa ihe ndị ubi vaịn ha mepụtara. (Aịza. 65:21) Chineke gọziri ọrụ ha rụrụ, ha dịkwara ogologo ndụ.​—Aịza. 65:22, 23.

Mmiri na-asọda asọda: Maridav/stock.adobe.com; ugwu: AndreyArmyagov/stock.adobe.com

Kpọnye VIDIO Si na Vidio Bụ́ Na-enwe Obi Ụtọ na Chineke Kwere Nkwa Ime Ka Udo Dị. Jụzie ụmụnna ajụjụ ndị a:

  • Olee otú amụma ndị e kwuru okwu ha na vidio a si emezu n’oge a?

  • Olee otú ha ga-esi emezu n’ụzọ ka ukwuu n’ụwa ọhụrụ?

  • Olee ndị nke ị kacha atụ anya ịhụ mgbe ha ga-emezu?

8. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ

Okwu Mmechi (Nkeji 3) | Abụ nke 58 na Ekpere