USORO IHE OMUME OZI ANYỊ NA OTÚ ANYỊ SI EBI NDỤ Ọgọst 2018
Ihe Gị na Mmadụ Nwere Ike Ikwurịta
Mkparịta ụka ndị eji gosi na ihe Baịbụl kwuru na-abara anyị uru kwa ụbọchi.
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE
Na-ekele Onye Meere Gị Ihe
Ndị niile chọrọ ime ihe dị Kraịst mma kwesịrị ịhụ mmadụ niile n’anya, na-ekelekwa onye ọ bụla meere ha ihe ọma n’agbanyeghị ebe onye ahụ si ma ọ bụ okpukpe onye ahụ na-ekpe.
OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Cheta Nwunye Lọt
Olee otú anyị ga-esi zere imebi adịm ná mma anyị na Chineke ka nwunye Lọt? Olee ihe anyị ga-eme ma anyị chọpụta na ịchụ ihe onwunwe na-emezi ka anyị ghara iji ofufe Chineke kpọrọ ihe?
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE
Mụta Ihe n’Ihe Atụ Maịna Iri Ahụ
N’ihe atụ ahụ Jizọs mere banyere maịna iri, gịnị ka nna ukwu ahụ, ndị ohu ahụ na ego ahụ nọchiri anya ya?
OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu nke Ọma n’Ozi Ọma—Ịchọta Ihe na JW.ORG
Ihe Ndị Anyị Ji Akụziri Ndị Mmadụ Ihe na-agwa ndị mmadụ ka ha gaa na jw.org. Ịmata otú anyị ga-esi na-achọta ihe na jw.org ga-enyere anyị aka ịna-emekwu nke ọma n’ozi anyị.
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE
“Nnapụta Unu Na-eru Nso”
N’oge na-adịghị anya, Jizọs ga-ebibi ndị ajọ omume ma zọpụta ndị ezi omume. Anyị kwesịrị ime ka anyị na Jehova dịrị ná mma ka anyị nwee ike iso ná ndị a ga-azọpụta.
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE
Dị Njikere Ịgbaghara Ndị Ọzọ
Anya Jehova Chineke na Ọkpara ya dị n’ebe ụmụ mmadụ na-ezughị okè nọ iji hụ onye chegharịrịnụ ka ha nwee ike ịgbaghara ya.
OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Jizọs Nwụkwara n’Ihi Nwanna Gị
Jizọs ji ndụ ya chụọ àjà maka ụmụ mmadụ na-ezughị okè. Olee otú anyị nwere ike isi na-egosi ụmụnna anyị na anyị hụrụ ha n’anya otú ahụ Kraịst hụrụ anyị?