Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Cheta Nwunye Lọt

Cheta Nwunye Lọt

Gịnị mere nwunye Lọt ji lee anya n’azụ mgbe o si Sọdọm na-agbapụ? Baịbụl agwaghị anyị. (Jen. 19:17, 26) Ma, amaokwu ndị gbara ihe ahụ Jizọs kwuru gburugburu gosiri na o nwere ike ịbụ na o chewere gbasara ihe ndị ọ hapụrụ na Sọdọm. (Luk 17:31, 32) Olee otú anyị ga-esi zere ime ka nwunye Lọt, ghara ime ihe ga-emebi adịm ná mma anyị na Chineke? Anyị ekwesịghị ikwe ka ịchụ ihe onwunwe bụrụ ihe kacha anyị mkpa ná ndụ. (Mat. 6:33) Jizọs sịrị na anyị “apụghị ịbụ ndị ohu Chineke na nke Akụnụba.” (Mat. 6:24) Ma, ọ bụrụkwanụ na anyị achọpụta na ịchụ ihe onwunwe na-emezi ka anyị ghara iji ihe gbasara ofufe Chineke kpọrọ ihe? Anyị nwere ike ịrịọ Jehova ka o nyere anyị aka ịghọta ebe ndị anyị kwesịrị imezitụ ihe, rịọkwa ya ka o nye anyị obi ike na ume iji mezie ha.

LEE MA Ị GA-ECHETA IHE E MERE NA VIDIO BỤ́ CHETA NWUNYE LỌT MA ZAA AJỤJỤ NDỊ NA-ESONỤ:

  • Olee otú m ga-esi gosi na m ‘na-echeta nwunye Lọt’?

    Olee otú nsogbu a na-enye Gloria ka ọ kpatakwuo ego si kpaa ya aka ọjọọ, ma n’otú o si eche echiche, otú o si ekwu okwu, nakwa n’ihe ndị ọ na-eme?

  • Olee ihe e ji ihe mere nwunye Lọt na-akụziri anyị taa?

  • Olee otú ime ihe Baịbụl kwuru si nyere Joe na ezinụlọ ya aka?

  • Olee otú ndị ha na Anna na-akpa n’ụlọ ọrụ ha si chọọ idufu ya?

  • Gịnị mere anyị ji kwesị inwe obi ike ma ọ bụrụ na a na-enye anyị nsogbu ime ka ịchụ ego bụrụ ihe kacha anyị mkpa ná ndụ?

  • Olee otú Brian na Gloria si maliteghachi ime ka ihe gbasara ofufe Chineke bụrụ ihe kacha ha mkpa?

  • Olee ihe ndị Baịbụl kwuru na-abara anyị uru ị chọpụtara mgbe ị na-ele vidio a?