OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu nke Ọma n’Ozi Ọma—Ịchọta Ihe na JW.ORG
IHE MERE O JI DỊ MKPA: Ihe Ndị Anyị Ji Akụziri Ndị Mmadụ Ihe na-agwa ndị mmadụ ka ha gaa na jw.org. Nke bụ́ eziokwu bụ na isi ihe mere e ji bipụta kaadị JW.ORG na traktị bụ́ Olee Otú Anyị Ga-esi Amata Azịza Ajụjụ Ndị Na-echu Anyị Ụra? bụ iji gwa ndị mmadụ gbasara ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet. I nwere ike isi na jw.org nye mmadụ akwụkwọ ma ọ bụ vidio ndị anyị ji akụziri ndị mmadụ ihe. I nwere ike izigara ya onye ahụ n’ozi iimel ma ọ bụkwanụ gị ezigara ya ebe ọ ga-apị ga-ebuga ya ebe ọ ga-enweta ya. Ihe a ga-enyere anyị aka, karịchaa ma ọ bụrụ na onye anyị na-ezi ozi ọma na-asụ asụsụ ọzọ. Ihe ọzọ bụ na mmadụ nwere ike ịjụ ajụjụ ndị azịza ha na-adịghị n’Ihe Ndị Anyị Ji Akụziri Ndị Mmadụ Ihe. Ịmata otú anyị ga-esi na-achọta ihe na jw.org ga-enyere anyị aka ịna-emekwu nke ọma n’ozi anyị.
OTÚ Ị GA-ESI EME YA:
-
Ebe e dere “IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI.” Ọ bụrụ na ị na-ezi nne ma ọ bụ nna chọrọ ịmatakwu otú e si azụ ụmụaka ozi ọma, pịa ebe e dere IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI, pịzie ebe e dere ALỤMDI NA NWUNYE NA EZINỤLỌ.
-
Ebe e dere “IHE NDỊ ANYỊ NWERE.” Ọ bụrụ na ị na-ezi nwa klas unu ozi ọma n’ụlọ akwụkwọ, chọọkwa inye ya ma ọ bụ gosi ya broshọ ahụ bụ́ Azịza Ajụjụ Iri Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, gaa ebe e dere IHE NDỊ ANYỊ NWERE, pịa ebe e dere AKWỤKWỌ NA BROSHỌ.
-
Ebe e dere “GBASARA ANYỊ.” Ọ bụrụ na ị na-ezi onye gị na ya na-arụ ọrụ chọrọ ịmatakwu ihe ndị anyị kweere ozi ọma, pịa ebe e dere GBASARA ANYỊ, pịzie ebe e dere AJỤJỤ NDỊ A NA-AJỤKARỊ BANYERE NDỊÀMÀ JEHOVA.
LEENỤ VIDIO AHA YA BỤ ỊCHỌTA IHE NA JW.ORG, MA CHỌPỤTA EBE MMADỤ GA-AGA NA JW.ORG MA Ọ CHỌỌ INYERE ỤDỊ NDỊ A NA-ESONỤ AKA:
-
onye na-ekweghị na Chineke
-
onye ọdachi dakwasịrị
-
nwanna na-anaghị ejekwa ozi
-
onye nletaghachi anyị jụrụ otú anyị si enweta ego anyị ji arụ ọrụ anyị
-
onye chọrọ ịmata ebe Ndịàmà Jehova na-anọ amụ ihe n’obodo ha