Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | LUK 19-20

Mụta Ihe n’Ihe Atụ Maịna Iri Ahụ

Mụta Ihe n’Ihe Atụ Maịna Iri Ahụ

19:12-24

Olee ihe ihe ndị ahụ Jizọs ji mee ihe atụ Maịna ahụ nọchiri anya ya?

  1. Nna ukwu ahụ nọchiri anya Jizọs

  2. Ndị ohu ahụ nọchiri anya ndị na-eso ụzọ ya e tere mmanụ

  3. Ego ahụ nna ukwu ahụ nyere ndị ohu ya nọchiri anya ihe ùgwù ha nwere ime ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs

N’ihe atụ ahụ, a dọrọ aka ná ntị banyere ihe ga-eme ma ọ bụrụ na ndị na-eso ụzọ Kraịst e tere mmanụ amalite ịkpa àgwà ka ajọ ohu ahụ. Jizọs chọrọ ka ndị na-eso ụzọ ya jiri ihe niile ha nwere na-ekwusasi ozi ọma ike.

Olee otú m nwere ike isi na-eṅomi Ndị Kraịst e tere mmanụ kwesịrị ntụkwasị obi n’ikwusa ozi ọma?