OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Jizọs Nwụkwara n’Ihi Nwanna Gị
Jizọs ji ndụ ya chụọ àjà maka ụmụ mmadụ na-ezughị okè. (Rom 5:8) O doro anya na obi dị gị ụtọ na Jizọs ji ndụ ya chụọ àjà maka anyị n’ihi na ọ hụrụ anyị n’anya. Ma, ọ dịkwa mkpa mgbe ụfọdụ ka anyị na-echetara onwe anyị na ọ nwụkwara maka ụmụnna anyị. Olee otú anyị nwere ike isi na-egosi ụmụnna anyị na anyị hụrụ ha n’anya otú ahụ Kraịst hụrụ anyị? Legodị ụzọ atọ anyị nwere ike isi na-eme ya. Nke mbụ, anyị nwere ike imeta ndị ọzọ na-abụghị naanị ndị si n’agbụrụ anyị enyi. (Rom 15:7; 2 Kọr. 6:12, 13) Nke abụọ, anyị kwesịrị ịkpachara anya ka anyị ghara ikwu ma ọ bụ mee ihe nwere ike ịkpasu ndị ọzọ iwe. (Rom 14:13-15) Nke atọ bụ na mmadụ mejọọ anyị, anyị kwesịrị ịgbaghara onye ahụ ozugbo. (Luk 17:3, 4; 23:34) Ọ bụrụ na anyị agbaa mbọ si n’ụzọ ndị a na-eṅomi Jizọs, Jehova ga-anọgide na-eme ka udo na ịdị n’otu dị n’ọgbakọ anyị.
LEENỤ VIDIO BỤ́ BỤRỤ NNỌỌ SỌ MMA!, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A: