Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ILU 12-16

Amamihe Dị Mma Karịa Ọlaedo

Amamihe Dị Mma Karịa Ọlaedo

Gịnị mere amamihe Chineke ji dị oké ọnụ ahịa? Ọ bụ n’ihi na ọ na-eme ka ndị nwere ya ghara ime ihe ọjọọ, meekwa ka ha dịrị ndụ. Ọ na-eme ka otú ha si ele ihe anya, otú ha si ekwu okwu, na otú ha si eme ihe ka mma.

Onye maara ihe anaghị adị mpako

16:18, 19

  • Onye maara ihe ma na ọ bụ Jehova na-enye amamihe

  • Ndị ihe na-agaziri na ndị a na-enyekwu ọrụ n’ọgbakọ kwesịrị ịkacha kpachara anya ka ha ghara ibido dịwa mpako

Onye maara ihe na-ekwu okwu na-eru mmadụ n’obi, nke na-agbakwa ume

16:21-24

  • Onye maara ihe na-agbalị chọpụta ebe ndị ọzọ na-eme nke ọma, na-ajakwa ha mma

  • Okwu ọma na-eru n’obi, na-atọkwa ka mmanụ aṅụ. Ọ naghị akpasu iwe