Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Otú Ị Ga-esi Eme Ka Azịza Gị Na-adị Mma

Otú Ị Ga-esi Eme Ka Azịza Gị Na-adị Mma

Azịza ndị dị mma na-ewuli ọgbakọ elu. (Rom 14:19) Ọ na-abakwara ndị zara ha uru. (Ilu 15:23, 28) N’ihi ya, ka anyị jisi ike na-aza ajụjụ n’ọmụmụ ihe, ọ bụrụgodị otu ugboro. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụghị mgbe niile anyị weliri aka ka a ga-akpọ anyị. Ọ bụ ya mere anyị kwesịrị iji kwadebe ọtụtụ azịza anyị ga-aza.

Azịza dị mma . . .

  • na-adị mfe nghọta, na-edo anya, ọ naghịkwa eto ogologo. Ọtụtụ mgbe, ọ na-ewe tịnkọm tịnkọm iri atọ ma ọ bụ ihe na-erughi ya

  • bụ nke mmadụ ji okwu nke aka ya zaa

  • abụghị ikwughachi ihe onye ọzọ kwurula

Ọ bụrụ gị ka e bu ụzọ kpọọ, . . .

  • zaa ihe dị mfe nghọta, zaakwa ihe a jụrụ

Ọ bụrụ na a zaala ihe a jụrụ, i nwere ike . . .

  • igosi otú amaokwu Baịbụl e dere ebe ahụ si gbasa ihe a na-amụ

  • ikwu otú ihe a na-amụ si gbasa anyị

  • ịkọwa otú anyị ga-esi jiri ya nyere ndị ọzọ aka

  • iji tịnkọm tịnkọm ole na ole kọọ otu ahụmahụ na-akụzi ihe dị mkpa