Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ILU 1-6

“Jiri Obi Gị Dum Tụkwasị Jehova Obi”

“Jiri Obi Gị Dum Tụkwasị Jehova Obi”

Jehova ruru eru ka anyị tụkwasị ya obi anyị niile. Ihe aha ya pụtara mere ka obi sie anyị ike na ọ ga-emezuli nkwa niile o kwere anyị. Ekpere ga-enyere anyị aka ịtụkwasị ya obi. Ilu isi 3 na-eme ka obi sie anyị ike na Jehova ga-eme ‘ka ụzọ anyị kwụrụ ọtọ’ ma ọ bụrụ na anyị atụkwasị ya obi.

Onye maara ihe n’anya onwe ya . . .

3:5-7

  • na-ekpebi ihe ọ ga-eme n’ebughi ụzọ mata ihe Jehova chọrọ

  • na-atụkwasị echiche nke ya ma ọ bụ echiche ụwa a obi

Onye tụkwasịrị Jehova obi . . .

  • na-amụ Baịbụl, na-atụgharị uche na ya, na-ekpekwa ekpere iji mee ka ya na Jehova dịrịkwuo ná mma

  • na-eleba anya na Baịbụl ka o nyere ya aka ime ezigbo mkpebi

OLEE OTÚ M NA-ESI EME MKPEBI?

NKE MBỤ: M na-ekpebi ime ihe obi m gwara m na ọ bụ ya kacha mma

NKE ABỤỌ: M na-arịọzi Jehova ka ọ gọzie ihe ahụ m kpebiri

NKE MBỤ: M na-ekpe ekpere, mụọkwa ihe ka m mata ihe Jehova chọrọ ka m mee

NKE ABỤỌ: M na-ekpebizi ime ihe kwekọrọ n’ihe Baịbụl kwuru