Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Ị̀ Na-eji Kaadị JW.ORG Ezi Ozi Ọma?

Ị̀ Na-eji Kaadị JW.ORG Ezi Ozi Ọma?

Ebe ọ bụ na oké mkpagbu ahụ adịla ezigbo nso, anyị kwesịrị ịgba mbọ na-ekwusasi ozi ọma ike. (Ilu 24:11, 12, 20) Anyị nwere ike iji kaadị JW.ORG mee ka ndị mmadụ mata gbasara adres Ịntanet anyị, matakwa na ọ dị mkpa ịmụ Okwu Chineke. Kaadị a nwere ihe mmadụ nwere ike iji ekwentị ya sere foto, ya ebuga ya n’ebe ọ ga-ele vidio bụ́ Olee Uru Ịmụ Baịbụl Ga-abara Gị? N’ebe ahụ, ọ ga-ahụkwa ebe ọ ga-ede na ọ chọrọ ka a bịa mụwara ya Baịbụl. Ụfọdụ ndị anaghị enwecha mmasị ịnara akwụkwọ anyị, ma ha ga-enwe mmasị ịga n’adres Ịntanet anyị. N’ihi ya, ahapụla inye ha kaadị a. Ma, enyekwala ya ndị na-enweghị mmasị n’ozi anyị.

Ka ị na-aga mkpa gị kwa ụbọchị, jiri kaadị a. Ị hụ onye ị chọrọ inye ya, i nwere ike ịsị ya: “O nwere kaadị m chọrọ inye gị. Ọ ga-eduga gị n’adres Ịntanet ebe e nwere akwụkwọ na vidio dị iche iche.” (Jọn 4:7) Ebe ọ bụ na kaadị a dị ntakịrị, ọ ga-adịrị gị mfe itinye ụfọdụ n’akpa gị ka ị na-aga ebe ọ bụla ị na-aga, adịghị ama ama gị ahụ onye ị ga-enye ya.