OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Ndị Na-eto Eto—Jehova Ọ̀ Bụ Ezigbo Enyi Unu?
Olee àgwà ndị ị chọrọ ka enyi gị nwee? O nwere ike ịbụ na ị chọrọ ka ọ bụrụ onye ị ga-atụkwasịli obi, onye nwere obiọma, na onye na-emesapụ aka. Jehova nwere àgwà ndị a niile. (Ọpụ. 34:6; Ọrụ 14:17) Ọ na-anụ ekpere gị. Ọ na-enyere gị aka mgbe ọ bụla enyemaka dị gị mkpa. (Ọma 18:19, 35) Ọ na-agbaghara gị mmehie gị. (1 Jọn 1:9) Jehova bụ enyi kacha enyi niile.
Olee otú i nwere ike isi bụrụ enyi Jehova? Na-agụ Baịbụl. Ime otú ahụ ga-eme ka ị mụta gbasara ya. Na-akọrọ ya obi gị. (Ọma 62:8; 142:2) Gosi na i ji ihe ndị dị Jehova mkpa kpọrọ ihe. Ihe ndị dị ka, Ọkpara ya, Alaeze ya, nakwa nkwa ndị o kwere maka ọdịnihu. Na-agwa ndị ọzọ gbasara ya. (Diut. 32:3) Ọ bụrụ na i mee ka gị na Jehova dịrị n’ezigbo mma, ọ ga-abụ enyi gị ruo mgbe ebighị ebi.—Ọma 73:25, 26, 28.
LEENỤ VIDIO BỤ́ NDỊ NA-ETO ETO—“DETỤNỤ JEHOVA IRE MA HỤ NA Ọ DỊ MMA” ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:
-
Olee otú ị ga-esi kwadebe maka inyefe Jehova onwe gị, e meekwa gị baptizim?
-
Olee otú ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ ga-esi nyere gị aka ife Jehova?
-
Olee otú ikwusa ozi ọma ga-esi eme ka gị na Jehova dịkwuo ná mma?
-
Olee ụzọ ndị i nwere ike isi jekwuoro Jehova ozi?
-
Olee ihe na-amasị gị gbasara Jehova?