E Mere Ka Ha Nwee Ike Ịrụ Ọrụ Jehova
Mmụọ nsọ Jehova nyeere Bezalel na Oholiab aka ịrụ ihe niile a chọrọ ịrụ n’ụlọikwuu. Mmụọ nsọ Jehova ga-enyekwara ndị ohu ya aka taa. Gịnị ka anyị ga-eme ka mmụọ nsọ nwee ike inyere anyị aka?
-
Anyị kwesịrị ịrịọ Jehova maka mmụọ nsọ ya ka o nyere anyị aka ịna-emekwu nke ọma n’ofufe ya
-
Anyị kwesịrị ịna-agụ Baịbụl kwa ụbọchị
-
Anyị kwesịrị itinye obi anyị niile n’ọrụ ọ bụla e nyere anyị
Olee ọrụ Jehova nwere ike ime ka ị rụọ?