Gbaaranụ Ikpere Arụsị Ọsọ
Ọ ga-abụ na otú ndị Ijipt si were ikpere arụsị gbanwere otú ndị Izrel si ele ikpere arụsị anya. Taa, e nwere ọtụtụ ụzọ ndị mmadụ si ekpere arụsị. O nwere ike isi ike ịmata na ụfọdụ n’ime ụzọ ndị ahụ bụ ikpere arụsị. N’agbanyeghị na e nwere ike anyị agaghị akpachara anya gaa kpewere arụsị, anyị nwere ike ịna-ekpere arụsị ma ọ bụrụ na anyị ekwe ka ihe na-agụ anyị agụụ mee ka anyị ghara iji obi anyị niile na-efe Jehova.
Olee ihe ndị dịịrị anyị kwa ụbọchị nwere ike ime ka m ghara iji obi m niile na-efe Jehova, oleekwa otú m nwere ike isi ghara ikwe ka ha dị m mkpa karịa ofufe Jehova?