Ọktoba 24-30
2 NDỊ EZE 1-2
Abụ nke 79 na Ekpere
Okwu Mmeghe (1 nkeji)
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE
“Onye E Ji Ama Atụ n’Ịzụ Ndị Ọzọ”: (Nkeji 10)
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke: (Nkeji 10)
2 Eze 2:11—Ebee ka Ịlaịja gara mgbe ‘oké ifufe bugoro ya n’eluigwe’? (w05 8/1 9 ¶1)
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a gbasara Jehova, ozi anyị, ma ọ bụ ihe ọzọ?
Ọgụgụ Baịbụl: (Nkeji 4) 2 Eze 2:1-10 (th ihe ọmụmụ nke 10)
MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA
Mkparịta Ụka nke Mbụ: (Nkeji 3) Jiri ihe dị n’ebe e dere Ihe Gị na Mmadụ Nwere Ike Ikwurịta mee ya. Zie ya ozi ọma n’agbanyeghị na o kwuru ihe ndị na-achọghị ịnụ ozi ọma na-ekwukarị. (th ihe ọmụmụ nke 12)
Nletaghachi: (Nkeji 4) Buru ụzọ mee ihe dị n’ebe e dere Ihe Gị na Mmadụ Nwere Ike Ikwurịta. Kọwaara ya otú anyị si amụrụ ndị mmadụ Baịbụl n’anaghị ha ego, gị enyezie ya kaadị maka ọmụmụ Baịbụl. (th ihe ọmụmụ nke 13)
Ọmụmụ Baịbụl: (Nkeji 5) lff nchịkọta isi nke 07, ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ, na ihe ị ga-agba mbọ mee (th ihe ọmụmụ nke 14)
OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
“Ihe Ndị Bara Uru Dị n’Akwụkwọ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi”: (Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Gbaa onye nkwusa ji akwụkwọ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi amụrụ mmadụ ihe ajụjụ ọnụ. Jụọ ya, sị: Gịnị na-amasị gị ma i jiri akwụkwọ a na-amụrụ mmadụ ihe? Olee otú vidio ndị dị na ya na ajụjụ ndị e ji amata ihe mmadụ chere si enyere onye a na-amụrụ ihe aka?
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ: (Nkeji 30) lff isi nke 24
Okwu Mmechi (Nkeji 3)
Abụ nke 66 na Ekpere