OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Ruo Mgbe A Ga-akpọlite Ndị Nwụrụ Anwụ n’Ọnwụ
Ọ bụrụ na mmadụ anwụnahụ anyị, olileanya anyị nwere na a ga-akpọlite ya n’ọnwụ na-akasi anyị obi. N’agbanyeghị olileanya a anyị nwere, mmehie na ọnwụ yiri ihe e ji kpuchie anyị niile nke na-ekweghị anyị megharịa ahụ́. (Aịza. 25:7, 8) O so n’ihe mere “ihe niile e kere eke” ji “na-asụkọ ude ọnụ, nọrọkwa n’ihe mgbu.” (Rom 8:22) Olee otú anyị ga-esi na-edi ọnwụ ndị nwụnahụrụ anyị ruo mgbe a ga-akpọlite ha n’ọnwụ? Baịbụl gwara anyị ihe ndị ga-enyere anyị aka.
LEENỤ VIDIO BỤ́ IHE GA-ENYERE GỊ AKA IDI ỌNWỤ ONYE Ị HỤRỤ N’ANYA, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:
-
Olee ihe na-agbawa obi mere Danielle nakwa Masahiro na Yoshimi nwunye ya?
-
Olee otú ihe ise a tụrụ n’aro si nyere ha aka?
-
Ònye kacha akasi ndị mmadụ obi?—2 Kọr. 1:3, 4