OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Chineke Achọghị Ka Di na Nwunye Tisaa
Ọ bụrụ na Ndị Kraịst bụ́ di na nwunye ana-ebi n’udo, ọ ga-eme ka a na-eto Jehova. Ha abụọ ga na-enwekwa obi ụtọ. (Mak 10:9) Anyị chọọ ka anyị na onye anyị ga-alụ na-ebi n’udo ma ghara itisa, anyị kwesịrị ime ihe Baịbụl kwuru mgbe anyị na-ahọrọ onye anyị ga-alụ.
Tupu gị na mmadụ akpawa, ọ kacha mma ka i chere ruo mgbe ‘ị na-abụghịzi nwata,’ ya bụ, mgbe i toferela oge agụụ mmekọahụ nwere ike imegharị gị anya. (1 Kọr. 7:36) Jiri oge ị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye mee ka gị na Chineke dị n’ezigbo mma. Jirikwa oge ahụ mụta ịna-akpa àgwà e ji mara Ndị Kraịst. Ihe ndị a ga-enyere gị aka ka gị na onye ị ga-emecha lụọ na-ebi n’udo.
Tupu gị ekweta ka gị na mmadụ lụọ, wepụta oge mata ‘ụdị mmadụ ọ bụ.’ (Ihe e dere n’ala ala peeji 1 Pita 3:4.) Ọ bụrụ na i nwewe obi abụọ ma ọ̀ ka ga-adabara unu, gị na ya kwurịta ya. Ihe kwesịrị ịbụ mkpa gị bụ ihe ị ga-emere onye ị chọrọ ịlụ, ọ bụghị ihe yanwa ga-emere gị. Ọ bụkwa ihe a na-eme ka mmadụ na ibe ya dị ná mma. (Fil. 2:3, 4) I mee ihe Baịbụl kwuru mgbe ị na-ahọrọ onye ị ga-alụ, ọ ga-adịrị gị mfe ịna-eme ya mgbe unu lụchara, unu ga na-ebikwa n’udo.
LEENỤ VIDIO BỤ́ ỊKWADEBE MAKA ALỤMDI NA NWUNYE—NKE ATỌ: “GBAKỌỌ IHE Ọ GA-EFU,” ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:
-
Olee otú ihe sibu na-agara nwanna nwaanyị ahụ na Shane?
-
Gịnị ka nwanna nwaanyị ahụ chọpụtara ka oge na-aga?
-
Olee otú ndị mụrụ ya si nyere ya aka? Oleekwa ihe dị mma o kpebiri ime?