Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Chọta Amamihe Ga-abara Gị Uru Kwa Ụbọchị na JW.ORG

Chọta Amamihe Ga-abara Gị Uru Kwa Ụbọchị na JW.ORG

Okwu Chineke na-akwadebe anyị nke ọma idi nsogbu ndị na-abịara anyị n’oge ikpeazụ a tara akpụ. (2 Tim. 3:1, 16, 17) Ma mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike ịchọ ka e nyere anyị aka chọta ndụmọdụ si na Baịbụl nke dabara ná nsogbu bịaara anyị. Dị ka ihe atụ, ị̀ bụ nne ma ọ bụ nna na-achọ ndụmọdụ ga-enyere gị aka ịzụ ụmụ? Ị̀ bụ onye na-eto eto ọnwụnwa na-ezoro ka mmiri? Ị̀ na-eru uju ọnwụ di gị ma ọ bụ nwunye gị? Ị gaa na jw.org, ị ga-achọta ndụmọdụ ndị si na Baịbụl ga-enyere gị aka n’ihe ndị a nakwa n’ihe ndị ọzọ.​—Ilu 2:3-6.

N’isi mbido jw.org, pịa ebe e dere IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI. (Lee foto nke 1.) N’ime isiokwu ndị ọ ga-ebupụtara gị, họrọ nke ị chọrọ. Ma ọ bụkwanụ, pịa ebe e dere IHE NDỊ ANYỊ NWERE, pịa ISIOKWU DỊ ICHE ICHE, họrọzie isiokwu nke ị chọrọ. (Lee foto nke 2.) Ị ga-ahụkwa isiokwu ndị a na JW Library®. a I nwere ike ịchọta isiokwu ga-amasị gị ma i lee isiokwu dị iche iche dị n’ebe ahụ. Mana, i nwekwara ike idenye isiokwu nke ị chọrọ n’ebe a na-achọ ihe na jw.org ka ọ chọtara gị ya.

Denye ihe ndị e dere n’okpuru ebe a n’ebe a na-achọ ihe. N’ime isiokwu ndị ọ chọtaara gị, detuo ndị nke ị ga-achọ ịgụ.

  • Ịzụ ụmụaka

  • Ndị na-eto eto ịda mbà

  • Ọnwụ di ma ọ bụ nwunye

a E nwere isiokwu ụfọdụ na-agba naanị na jw.org ka ọ dị ugbu a.