Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe I Nwere Ike Ikwu

Ihe I Nwere Ike Ikwu

ỤLỌ NCHE

Ajụjụ: Anyị niile na-achọ ka a kasie anyị obi mgbe ụfọdụ. Ma olee ebe anyị ga-esi enweta nkasi obi?

Amaokwu Baịbụl: 2 Kọr. 1:3, 4

Otú a ga-esi enye ya: Isiokwu Ụlọ Nche a kọwara otú Chineke si akasi anyị obi.

ỤLỌ NCHE (peeji nke 16)

Ajụjụ: Ụfọdụ chere na Alaeze Chineke bụ ihe dị mmadụ n’obi; ndị ọzọ echee na ọ bụrụ na ụmụ mmadụ emee ka udo dịrị n’ụwa, na alaeze abịala. Gịnị ka i chere?

Amaokwu Baịbụl: Dan. 2:44

Otú a ga-esi enye ya: Baịbụl kwuru na Alaeze Chineke bụ ọchịchị dị adị. Isiokwu a ga-akọwa ihe ndị ọzọ Baịbụl kwuru banyere Alaeze Chineke.

NA-AKỤZI EZIOKWU

Ajụjụ: Olee otú anyị ga-esi amata ma ihe banyere anyị ọ̀ na-emetụ Chineke n’obi?

Amaokwu Baịbụl: 1 Pita 5:7

Eziokwu: Chineke chọrọ ka anyị na-akọrọ ya mkpa anyị n’ekpere n’ihi na ihe banyere anyị na-emetụ ya n’obi.

DEE OTÚ Ị GA-ESI EME NKE GỊ

Jiri aro ndị a dị́ ebe a dee otú ọzọ ị ga-achọ isi jiri akwụkwọ ndị a zie ozi ọma.