Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Emela Ihe Ndị A Mgbe Ị Na-amụrụ Mmadụ Ihe

Emela Ihe Ndị A Mgbe Ị Na-amụrụ Mmadụ Ihe

Ikwu Oké Okwu: Echela na ị ga-akọwachara ya ihe niile otu mgbe. Jizọs ji ajụjụ mee ka ndị mmadụ chee echiche ma ghọta ihe ọ na-ekwu. (Mat. 17:24-27) Ịjụ onye ị na-amụrụ ihe ajụjụ ga-eme ka ọmụmụ ihe unu dị ụtọ, meekwa ka ị mata ihe ndị o kweere nakwa ma ọ̀ na-aghọtakwa ihe unu na-amụ. (be 253 ¶3-4) Ị jụọ ya ajụjụ, nwee ndidi ka ọ zaa. Ọ bụrụ na ọ zataghị ya, agwala ya aziza ya, kama, jirikwa ajụjụ ndị ọzọ nyere ya aka ịzata ya. (be 238 ¶1-2) Jiri nwayọọ kọwaara ya ihe otú ọ ga-aghọta ya.—be 230 ¶4.

Ime Ka Ihe Gbagwojuo Anya: Agwala onye ị na-amụrụ ihe ihe niile ị ma gbasara ihe unu na-amụ. (Jọn 16:12) Ihe ị ga-elekwasị anya na ya bụ isi ihe e kwuru na paragraf unu na-atụle. (be 226 ¶4-5) Ma, ọ bụrụ na ị kọọrọ ya ọtụtụ ihe ndị ọzọ gbasara ihe unu na-amụ, o nweziri ike ime ka ihe niile gbaa ya gharịị. (be 235 ¶3) Onye ahụ ghọtahaala ihe bụ́ isi e kwuru na paragraf ahụ, gafee na paragraf ọzọ.

Ịmụcha Ọtụtụ Paragraf: Ihe bụ́ mkpa anyị bụ ka ihe anyị na-amụrụ mmadụ ruo ya n’obi, ọ bụghị ka anyị mụchaa ọtụtụ paragraf. (Luk 24:32) Jiri amaokwu Baịbụl dị na pafagraf unu nọ na ya mee ka isi ihe unu na-amụ doo ya anya. (2 Kọr. 10:4; Hib. 4:12; be 144 ¶1-3) Jiri ihe atụ ndị dị mfe kọwaara ya ihe unu na-amụ. (be 245 ¶2-4) Gbalịa mata ihe onye ahụ kweere na ihe ndị na-enye ya nsogbu. Chọpụtazie otú ị ga-esi jiri ihe unu na-amụ nyere ya aka. Jụọ ya ajụjụ ndị dị ka: “Olee otú obi dị gị maka ihe ndị a ị na-amụta?” “Gịnị ka ihe a anyị na-amụ na-akụziri anyị gbasara Jehova?” “Olee uru ị ga-erite ma ọ bụrụ na i mee ha?”—be 238 ¶3-5; 259 ¶1.