Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu Nke Ọma n’Ozi Ọma—Na-agba Ndị Nwere Mmasị Ume Ka Ha Bịawa Ọmụmụ Ihe

Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu Nke Ọma n’Ozi Ọma—Na-agba Ndị Nwere Mmasị Ume Ka Ha Bịawa Ọmụmụ Ihe

IHE MERE O JI DỊ MKPA: Ọmụmụ ihe anyị na-abụkarị oge magburu onwe ya iji ‘bụkuo Jehova abụ’ ma too ya. (Ọma 149:1) A na-anọkwa na ya akụziri anyị otú anyị ga-esi na-eme uche Chineke. (Ọma 143:10) Ọ na-abụkarị ndị nwere mmasị na ndị anyị na-amụrụ ihe bido bịawa ọmụmụ ihe, ha emewekwuo nke ọma.

OTÚ Ị GA-ESI EME YA:

  • E gbula oge ịgwa ha ka ha bịawa ọmụmụ ihe. Echela ka unu mụwa ihe tupu gị agwa ha maka ya.—Mkpu. 22:17

  • Kọwaara onye ahụ otú ọmụmụ ihe anyị na-adị, gwakwa ya ihe a ga-amụ na nke na-abịanụ. Ihe ndị ga-enyere gị aka ime ya bụ: Akwụkwọ anyị ji akpọ ndị mmadụ òkù ka ha bịa ọmụmụ ihe anyị, vidio Gịnị Ka A Na-eme n’Ụlọ Nzukọ Alaeze?, na broshọ Uche Jehova isi nke 5 na nke 7

  • I nwere ike ibuga ya ọmụmụ ihe ma ọ bụ gbaara ya ụgbọ, ma ọ bụkwanụ nyere ya aka họta uwe dị mma ọ ga-eyi abịa. Ọ bụrụ na ọ bịa, ọ ga-adị mma ka gị na ya nọrọ ka o nwee ike ịna-ele anya n’akwụkwọ gị. Meekwa ka ya na ụmụnna ndị ọzọ kelee