Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ABỤ ỌMA 119

“Na-eje Ije n’Iwu Jehova”

“Na-eje Ije n’Iwu Jehova”

Ije ije n’iwu Jehova pụtara iji obi anyị niile na-eme ihe ọ chọrọ. E nwere ọtụtụ ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl ji obi ha niile mee ihe Jehova chọrọ ma tụkwasị ya obi, otú ahụ Devid mere.

Ihe ga-eme ka anyị na-enwe ezigbo obi ụtọ bụ idebe iwu Chineke

119:1-8

Jọshụa ji obi ya niile tụkwasị Jehova obi, na-emekwa ihe ọ bụla o kwuru. Ọ ma na ọ bụ ime otú ahụ ga-eme ka o nwee obi ụtọ, ihe agaziekwara ya

Okwu Chineke na-enye anyị obi ike anyị ga-eji die ọnwụnwa ndị na-abịara anyị

119:33-40

Jeremaya nwere obi ike ma tụkwasị Jehova obi mgbe ọ nọ ná nsogbu. O biri ndụ dị mfe, ọ hapụghịkwa ozi ya

Accurate knowledge of God’s Word gives us confidence to preach

119:41-48

Ịmụta eziokwu dị n’Okwu Chineke nke ọma ga-eme ka anyị na-ekwusa ozi ọma n’atụghị egwu

Pọl atụghị egwu izi onye ọ bụla ozi ọma. Obi siri ya ike na Jehova ga-enyere ya aka mgbe ọ katara obi gaa zie Gọvanọ Felix ozi ọma

Olee ebe ndị m chọrọ ịkatakwu obi zie ozi ọma?

  • N’ụlọ akwụkwọ

  • N’ebe m na-arụ ọrụ

  • N’ụlọ anyị

  • N’ebe ndị ọzọ