Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Ọ Bụrụ na Ọ Bụ Nwatakịrị Ka Ị Hụrụ n’Ụlọ

Ọ Bụrụ na Ọ Bụ Nwatakịrị Ka Ị Hụrụ n’Ụlọ

Ọ bụrụ na anyị agaa ozi ọma kụọ aka n’ọnụ ụzọ, nwatakịrị apụta, anyị kwesịrị ịgwa ya ka ọ kpọọrọ anyị ndị mụrụ ya. Ime otú ahụ ga-egosi na anyị na-akwanyere ndị mụrụ ya ùgwù. (Ilu 6:20) Nwatakịrị ahụ sịgodị anyị batawa, anyị ekwesịghị ịbanye. Ọ bụrụ na ndị mụrụ ya anọghị n’ụlọ, anyị kwesịrị ịpụ ma laghachi mgbe ọzọ.

Ọ bụrụgodi na nwatakịrị ahụ eruola afọ iri na itoolu, anyị ka kwesịkwara ịjụ ya banyere ndị mụrụ ya. Ma, ndị mụrụ ya anọghị ya, anyị nwere ike ịjụ ya ma ọ̀ bụ ha na-ahọtara ya akwụkwọ ọ na-agụ. Ya sị mba, anyị nweziri ike inye ya akwụkwọ ma gwa ya ka ọ gaa na jw.org/ig.

Mgbe ọ bụla anyị gara nletaghachi na nke onye na-eto eto, anyị kwesịrị ịgwa ya na anyị ga-achọ ka anyị na ndị mụrụ ya hụ. Anyị hụ ha, anyị agwazie ha ihe mere anyị ji bịa ma gosi ha ezigbo ndụmọdụ dị na Baịbụl ga-abara ezinụlọ ha uru. (Ọma 119:86, 138) Ọ bụrụ na anyị ana-akwanyere ndị nne na nna ùgwù, ọ ga-eme ka ha na-ele anyị anya ọma. O nwekwara ike ime ka ha na-anabata anyị mgbe ọ bụla anyị bịara izi ha ozi ọma.—1 Pita 2:12.