Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu nke Ọma n’Ozi Ọma​—⁠Ịmalite Mkparịta Ụka Ga-eme Ka Anyị Zie Mmadụ Ozi Ọma

Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu nke Ọma n’Ozi Ọma​—⁠Ịmalite Mkparịta Ụka Ga-eme Ka Anyị Zie Mmadụ Ozi Ọma

Ihe mere Jizọs ji nwee ike izi nwaanyị Sameria ahụ ozi ọma bụ na ọ malitere ịkpanyere ya ụka. Olee otu anyị ga-esi na-emekwu nke ọma n’ibu ụzọ na-akpanyere ndị anyị na-amaghị ụka?

  • Na-emesapụ ihu, dịkwa njikere ịkpanyere ndị mmadụ ụka. N’agbanyeghị na ike gwụrụ Jizọs, ọ rịọrọ nwaanyị Sameria ahụ ka o nye ya mmiri ka ọ ṅụọ, si otú ahụ malite ịkpanyere ya ụka. I nwekwara ike ịmụmụrụ mmadụ ọnụ ọchị, ma malitezie ikwu banyere otú ihu ígwé dị ma ọ bụ gbasara ihe mere n’oge na-adịchabeghị anya. Cheta na ebumnobi gị bụ ịmalite mkparịta ụka. N’ihi ya, kwuo gbasara ihe ọ bụla i chere ga-amasị onye ahụ. Ọ bụrụ na onye ahụ agba gị nkịtị, nsogbu adịghị. Chọọ onye ọzọ ị ga-agwa okwu. Rịọkwa Jehova ka o nyere gị aka ịkata obi.—Nehe. 2:4; Ọrụ 4:29.

  • Dịrị njikere iji ohere ọ bula dapụtaranụ zie ozi ọma, ma, ya adịkwala gị oké ngwa ngwa. Ekwela ka ọ dị onye ahụ ka ị̀ na-amanye ya ikwu okwu, n’ihi na ọ ga-eme ka ahụ́ ghara iru ya ala, ya agbazie gị nkịtị. Ya ewutela gị ma ọ bụrụ na mkparịta ụka unu akwụsị tupu gị ezie ya ozi ọma. Ọ bụrụ na ọ na-esiri gị ike ịmalite izi ndị mmadụ ozi ọma, gbalịa na-ekwusara ndị mmadụ okwu n’ebughị n’obi izi ozi ọma. [Leenụ vidio nke mbụ, kwurịtakwanụ ihe unu mụtara na ya.]

  • Gbalịa kwuo ihe ga-eme ka i zie mmadụ ozi ọma, dị ka, ikwu otú obi dị gị maka ihe i kweere nke nwere ike ime ka onye ahụ jụọ gị ajụjụ. Jizọs kwuru ihe ndị mere ka nwaanyị Sameria ahụ jụọ ya ajụjụ. Mgbe Jizọs maliteziri izi nwaanyị ahụ ozi ọma, ọ bụ azịza ajụjụ ya ka ọ na-aza ya. [Leenụ vidio nke abụọ, kwurịtanụ ihe unu mụtara na ya, lezienụ vidio nke atọ, kwurịtakwanụ ihe unu mụtara na ya.]