Jizọs Ezie Nwaanyị Sameria Ozi Ọma
Gịnị nyeere Jizọs aka izi nwaanyị Sameria ahụ ozi ọma?
-
4:7—Kama ịgwawa nwaanyị ahụ gbasara Alaeze Chineke ma ọ bụ ime ka ọ mara na ya bụ Mesaya, o bu ụzọ rịọ ya ka o nye ya mmiri ka ọ ṅụọ
-
4:9—O ledaghị nwaanyị Sameria ahụ anya n’ihi agbụrụ ya
-
4:9, 12—Mgbe nwaanyị ahụ kwuru ihe ndị nwere ike ime ka ya na Jizọs rụwa ụka, Jizọs ji akọ zere ha ma lekwasị anya n’ihe ọ chọrọ ịgwa ya.—cf 77 ¶3
-
4:10—O ji ihe atụ metụtara ihe nwaanyị ahụ na-eme kwa ụbọchị malite ịgwa ya okwu
-
4:16-19—N’agbanyeghị na nwaanyị ahụ na-ebi ndụ rụrụ arụ, Jizọs kwanyeere ya ùgwù
Olee otú akụkọ a si gosi na ọ dị mkpa anyị ịna-agba àmà mgbe anyị na-anọghị n’ozi?