Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JỌN 5-6

Buru Ezi Ihe n’Obi Na-eso Jizọs

Buru Ezi Ihe n’Obi Na-eso Jizọs

6:9-11, 25-27, 54, 66-69

Mgbe Jizọs mere ihe atụ siiri ndị na-eso ụzọ ya ike ịghọta, ụfọdụ n’ime ha sụrụ ngọngọ ma kwụsị iso ya. Ma n’ụbọchị bu ya ụzọ, Jizọs ji ọrụ ebube nye ha nri, si otú ahụ gosi na ike ya sitere n’ebe Chineke nọ. Gịnị meziri ha ji sụọ ngọngọ? O doro anya na ọ bụ n’ihi na ha bu naanị ọdịmma ha na ihe ha ga-erita n’obi na-eso Jizọs.

Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya, sị: ‘Olee ihe mere m ji na-eso ụzọ Jizọs? Ọ̀ bụ n’ihi ngọzi ndị m na-enweta ugbu a na ndị nke m ga-enweta n’ọdịnihu? Ka ọ̀ bụ n’ihi na m hụrụ Jehova n’anya ma chọọkwa ime ihe ga-adị ya mma?’

Olee ihe mere anyị nwere ike iji sụọ ngọngọ ma ọ bụrụ na ihe bụ́ isi mere anyị ji na-efe Jehova bụ maka ihe ndị a na-esonụ?

  • Obi ụtọ anyị na-enwe na anyị so ndị Chineke na-emekọ ihe

  • Anyị chọrọ ibi na Paradaịs