Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

E Nweghị Ihe Ọ Bụla Lara n’Iyi

E Nweghị Ihe Ọ Bụla Lara n’Iyi

Mgbe Jizọs ji ọrụ ebube nyechaa puku ụmụ nwoke ise na ọtụtụ ụmụ nwaanyị na ụmụaka nri, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Tụtụkọtanụ ihe ha rifọrọ, ka ihe ọ bụla ghara ịla n’iyi.” (Jọn 6:12) Iji gosi na obi dị ya ụtọ maka ihe ndị Jehova nyere, Jizọs ekweghị ka nri ndị ahụ fọrọnụ laa n’iyi.

N’oge anyị a, Òtù Na-achị Isi na-agbalị ime ka Jizọs. Ha na-eji ego nakwa ihe ndị ọzọ e nyere n’onyinye eme ihe bara uru. Dị ka ihe atụ, mgbe a na-arụ isi ụlọ ọrụ anyị dị na Wọwik, Niu Yọk, ha họọrọ ịrụ ụdị ụlọ ndị ga-eme ka a ghara ịna-emefusi ego ndị mmadụ nyere n’onyinye.

OLEE OTÚ ANYỊ NWERE IKE ISI GHARA ỊLA IHE N’IYI . . .

  • mgbe anyị gara ọmụmụ ihe?

  • mgbe anyị na-ewere akwụkwọ maka onwe anyị? (km 5/09 3 ¶4)

  • mgbe anyị na-ewere akwụkwọ anyị ji aga ozi ọma? (mwb17.02 4 ¶1)

  • mgbe anyị nọ n’ozi ọma? (mwb17.02 4 ¶2, igbe)