Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JỌN 7-8

Jizọs Nyere Nna Ya Otuto

Jizọs Nyere Nna Ya Otuto

7:15-18, 28, 29; 8:29

Jizọs nyere Nna ya otuto n’ihe niile o kwuru na n’ihe niile o mere. Ọ chọrọ ka ndị mmadụ mata na ihe ndị ọ na-akụzi si n’aka Chineke. Ọ bụ ya mere o ji ekwukarị ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ mgbe niile ma ọ kụziwe ihe. Mgbe ọ bụla e toro Jizọs, kama ịnara otuto ahụ, ọ na-enye ya Jehova. Ihe kacha ya mkpa bụ ịrụcha ọrụ Jehova nyere ya.—Jọn 17:4.

Olee otú anyị ga-esi eṅomi Jizọs mgbe . . .

  • anyị na-akụziri mmadụ Baịbụl na mgbe anyị na-eme ihe omume n’Ụlọ Nzukọ Alaeze?

  • ndị ọzọ na-eto anyị?

  • anyị na-ekpebi ihe anyị ga-eji oge anyị eme?