Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Na-echeta Jehova Mgbe Niile

Na-echeta Jehova Mgbe Niile

Ọ bụrụ na ọ na-esiri anyị ike ịchọta ọrụ, o nwere ike isiri anyị ike ibu ụzọ na-achọ Alaeze Chineke na ezi omume ya. Anyị nwere ike ịchọwa ịnara ọrụ ga-egbochi anyị ịna-efe Chineke nke ọma ma ọ bụ nke ga-eme ka anyị mebie iwu Chineke. Ma, obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova ‘na-egosi ike ya maka ndị ji obi ha niile na-efe ya.’ (2 Ihe 16:9) O nweghị ihe ga-egbochi Nna anyị hụrụ anyị n’anya ịna-enyere anyị aka na ịna-egboro anyị mkpa anyị. (Rom 8:32) N’ihi ya, anyị kpebiwe ụdị ọrụ anyị ga-arụ, anyị kwesịrị ịtụkwasị Jehova obi ma lekwasị anya n’ofufe ya.​—Ọma 16:8.

LEENỤ VIDIO BỤ́ JIRI OBI GỊ DUM NA-ARỤRỤ JEHOVA ỌRỤ, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Gịnị mere Jason ji jụ ịna aka azụ?

  • Olee otú ihe e kwuru ná Ndị Kọlọsi 3:23 si gbasa anyị?

  • Olee uru àgwà ọma Jason baara Thomas?

  • Kwe ka Jehova na-eduzi gị ná mkpebi ọ bụla ị na-eme na n’ihe ọ bụla ị na-eme

    Olee otú ihe e kwuru na Matiu 6:22 si gbasa anyị?