Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Zie Ndị Mmadụ Ozi Ọma Bụ́ na Ụwa Ọhụrụ Dị Nso

Zie Ndị Mmadụ Ozi Ọma Bụ́ na Ụwa Ọhụrụ Dị Nso

N’ọnwa Nọvemba, anyị ga-agba mbọ pụrụ iche zie ndị mmadụ ozi ọma bụ́ na ụwa ọhụrụ dị nso. (Ọma 37:​10, 11; Mkpu. 21:​3-5) Hazigharịa ihe ndị ị chọrọ ime n’ọnwa ahụ ka i nwee ike iji oge buru ibu soro mee mkpọsa a. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka n’ọnwa ahụ, i nwere ike ịhọrọ inye awa iri atọ ma ọ bụ iri ise.

Dịrị njikere ịgụrụ onye ọ bụla otu amaokwu Baịbụl kwuru banyere ụwa ọhụrụ ma o kwe mee. Ị họrọwa amaokwu Baịbụl ị ga-agụ, chee banyere ihe ga-amasị ndị bi n’ókèala unu. Ọ bụrụ na onye i ziri ozi ọma nwere mmasị, nye ya Ụlọ Nche ọhaneze nke 2 nke afọ 2021. Gaghachi na nke ya ngwa ngwa o kwere mee, gbalịakwa jiri broshọ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi malitere ya ọmụmụ Baịbụl. Obi dị anyị ezigbo ụtọ na anyị ji oge anyị niile na-ekwusa ozi ọma nke “ihe ka mma.”​—Aịza. 52:7.

LEENỤ VIDIO EGWÚ BỤ́ ALAEZE CHINEKE NA-ABỊA, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Olee ọdịnihu magburu onwe ya nwata nwaanyị ahụ na-atụgharị n’uche?

  • Olee ihe ụfọdụ ị na-atụ anya ha ga-eme n’ụwa ọhụrụ?

  • Olee otú ịtụgharị uche n’olileanya i nwere ga-esi nyere gị aka iji oge buru ibu soro mee mkpọsa a a ga-eme n’ọnwa Nọvemba?​—Luk 6:45