Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Jehova Na-azọpụta Ndị Ike Ụwa Gwụrụ

Jehova Na-azọpụta Ndị Ike Ụwa Gwụrụ

E nweghị onye obi na-anaghị ajọ njọ mgbe ụfọdụ. Ọ bụrụ na obi jọrọ anyị njọ, ọ pụtaghị na anyị enweghị okwukwe na Jehova. A sị ka e kwuwe, Jehova kwudịrị na e nwere mgbe ụfọdụ obi na-ajọ ya njọ. (Jen. 6:5, 6) Ma, gịnị ka anyị ga-eme ma ọ bụrụ na obi na-ajọ anyị njọ ọtụtụ mgbe ma ọ bụdị mgbe niile?

Rịọ Jehova ka o nyere gị aka. Ọ na-amasị Jehova ịmara otú obi dị anyị na otú anyị si eche echiche. Ọ ma mgbe obi dị anyị ụtọ na mgbe obi jọrọ anyị njọ. Ọ ghọtara ihe mere anyị ji eche echiche otú anyị si eche nakwa ihe mere obi ji adị anyị otú ọ na-adị anyị. (Ọma 7:9b) Nke ka nke bụ na ihe banyere anyị na-emetụ Jehova n’obi, o nwekwara ike inyere anyị aka mgbe obi na-ajọ anyị njọ ma ọ bụdị mgbe obi dara anyị mbà.—Ọma 34:18.

Chebe uche gị. Ọ bụrụ na anyị adaa mbà n’obi, obi nwere ike ịna-ajọ anyị njọ, o nwekwara ike ịkpa ofufe anyị na-efe Jehova aka ọjọọ. N’ihi ya, anyị kwesịrị ichebe obi anyị, ya bụ, ụdị ndị anyị bụ.—Ilu 4:23.

LEENỤ VIDIO BỤ́ OTÚ ỤMỤNNA ANYỊ SI NA-ENWE UDO N’AGBANYEGHỊ OBI ỊDA MBÀ, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Gịnị na gịnị ka Nikki mere iji die ịda mbà n’obi?

  • Gịnị mere Nikki ji chee na o kwesịrị ịga ụlọ ọgwụ?—Mat. 9:12

  • Olee ụzọ dị iche iche Nikki si gosi na ọ tụkwasịrị Jehova obi ka o nyere ya aka?