Ọktoba 2-8
JOB 1-3
Abụ nke 141 na Ekpere
Okwu Mmeghe (1 nkeji)
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE
“Nọgide Na-egosi Otú Ị Hụruru Jehova n’Anya”: (Nkeji 10)
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke: (Nkeji 10)
Job 1:10—Olee otú amaokwu a si enyere anyị aka ịghọta ihe Jizọs kwuru na Matiu 27:46? (w21.04 11 ¶9)
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a gbasara Jehova, ozi anyị, ma ọ bụ ihe ọzọ?
Ọgụgụ Baịbụl: (Nkeji 4) Job 3:1-26 (th ihe ọmụmụ nke 12)
MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA
Mkparịta Ụka nke Mbụ: (Nkeji 3) Jiri isiokwu a na-ekwu gbasara ya n’Ihe Gị na Mmadụ Nwere Ike Ikwurịta malite. Gwazie ya gbasara adres Ịntanet anyị, nyekwa ya kaadị jw.org. (th ihe ọmụmụ nke 9)
Nletaghachi: (Nkeji 4) Jiri isiokwu a na-ekwu gbasara ya n’Ihe Gị na Mmadụ Nwere Ike Ikwurịta malite. Gosi ya vidio bụ́ Olee Uru Ịmụ Baịbụl Ga-abara Gị? Mee ka ị̀ kpọnyeere ya vidio ahụ, unu emeekwa ozugbo ka ùnu elechaala ya. Kwurịtazienụ ihe dị na ya. (th ihe ọmụmụ nke 20)
Okwu: (Nkeji 5) w22.01 11-12 ¶11-14—Isiokwu: Na-akụzi Ihe Nke Ọma Ka Jems—Ezola Ọnụ, Dịrịkwa Umeala n’Obi. (th ihe ọmụmụ nke 18)
OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Echere M na Ihe Niile Na-aga Ọfụma ná Ndụ M: (Nkeji 10) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Kpọnye vidio bụ́ Echere M na Ihe Niile Na-aga Ọfụma ná Ndụ M. Jụzie ụmụnna ajụjụ ndị a: Gịnị mere Nwanna Birdwell ji chee na “ihe niile na-aga ọfụma” ná ndụ ya?
Olee otú ichebara Matiu 6:33 echiche si baara ya uru?
Olee ihe ọzọ masịrị gị n’ihe Nwanna Birdwell kọrọ gbasara ezinụlọ ya?
“Jiri Ihe Ndị Na-agba n’Isimbido JW.ORG Na-ekwusa Ozi Ọma”: (Nkeji 5) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ: (Nkeji 30) lff isi nke 59 nọmba nke 6 na nchikọta, ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ, na ihe ị ga-agba mbọ mee
Okwu Mmechi (Nkeji 3)
Abụ nke 129 na Ekpere