OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Nyere Ndị Na-enweghị Mmasị n’Okpukpe Aka Ka Ha Mata Onye Kere Ha
È nwere mgbe ị na-ahapụ izi ndị na-enweghị mmasị n’okpukpe ozi ọma, na-eche na o nwere ike ha agaghị ege ntị? Ọ bụrụ otú ahụ, cheta na e nwere ọtụtụ ndị na-enweghị mmasị n’okpukpe nakwa ndị na-ekweghị na Chineke dị bụ́ Ndịàmà Jehova ugbu a. Ọtụtụ mgbe, naanị ihe dị mkpa bụ inyere ha aka ka ha leba anya n’ihe ndị gosiri na Chineke dị adị.—Rom 1:20; 10:14.
Olee otú akụkọ Tommaso si nyere gị aka ịghọta na i kwesịrị ịna-ezi ndị na-enweghị mmasị n’okpukpe ozi ọma?