Ọktoba 30–Nọvemba 5
JOB 11-12
Abụ nke 87 na Ekpere
Okwu Mmeghe (1 nkeji)
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE
“Ụzọ Atọ Anyị Ga-esi Enweta Amamihe ma Rite Uru na Ya”: (Nkeji 10)
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke: (Nkeji 10)
Job 12:11—Olee otú ihe e kwuru n’amaokwu a ga-esi nyere anyị aka ịna-ege ntị nke ọma? (w08 8/1 11 ¶5)
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a gbasara Jehova, ozi anyị, ma ọ bụ ihe ọzọ?
Ọgụgụ Baịbụl: (Nkeji 4) Job 12:1-25 (th ihe ọmụmụ nke 5)
MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA
Mkparịta Ụka nke Mbụ: (Nkeji 4) Jiri isiokwu a na-ekwu gbasara ya n’Ihe Gị na Mmadụ Nwere Ike Ikwurịta malite. Gwazie ya otú anyị na ndị mmadụ si amụ Baịbụl, nyekwa ya kaadị maka ọmụmụ Baịbụl. (th ihe ọmụmụ nke 1)
Nletaghachi: (Nkeji 3) Jiri isiokwu a na-ekwu gbasara ya n’Ihe Gị na Mmadụ Nwere Ike Ikwurịta malite. Gwa ya ka ọ bịa ọmụmụ ihe. Gosikwa ya vidio bụ́ Gịnị Ka A Na-eme n’Ụlọ Nzukọ Alaeze? Mee ka ị̀ kpọnyeere ya vidio ahụ, unu emeekwa ozugbo ka ùnu elechaala ya. Kwurịtazienụ ihe dị na ya. (th ihe ọmụmụ nke 13)
Ọmụmụ Baịbụl: (Nkeji 5) lff nchịkọta isi nke 12, ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ, na ihe ị ga-agba mbọ mee (th ihe ọmụmụ nke 19)
OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
“Ndị Nne na Nna, Nyerenụ Ụmụ Unu Aka Ka Ha Nweta Amamihe Chineke”: (Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. A ga-elekwa vidio.
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ: (Nkeji 30) rr isi nke 1 ¶1-7 na vidio kọwara isiokwu a na-amụ a
Okwu Mmechi (Nkeji 3)
Abụ nke 3 na Ekpere
a Mgbe ọ bụla e kwuru ka e lee vidio kọwara isiokwu a na-amụ, a ga-ebu ụzọ lee vidio ahụ tupu a mụwa paragraf ndị e kwesịrị ịmụ.