Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọktoba 7-13

ABỤ ỌMA 92-95

Ọktoba 7-13

Abụ nke 84 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

1. Ife Jehova Bụ Ihe Kacha Mma Mmadụ Nwere Ike Iji Ndụ Ya Eme

(Nkeji 10)

Jehova ruru eru ka anyị na-efe ya ofufe (Ọma 92:1, 4; w18.04 26 ¶5)

Ọ na-enyere ndị na-efe ya aka ime mkpebi ndị dị mma ma na-enwe obi ụtọ (Ọma 92:5; w18.11 20 ¶8)

O ji ha kpọrọ ihe, ma mgbe ha merela agadi (Ọma 92:12-15; w20.01 19 ¶18)

JỤỌ ONWE GỊ, SỊ: ‘Gịnị na-egbochi m inyefe Jehova onwe m na ime baptizim?’

2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke

(Nkeji 10)

  • Ọma 92:5​—Olee otú okwu ndị a si gosi na Jehova ma ihe? (cl 176 ¶18)

  • Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?

3. Ọgụgụ Baịbụl

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA

4. Ịmalite Mkparịta Ụka

(Nkeji 4) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. Ka gị na onye ahụ na-ekwurịta okwu, chọta otú ị ga-esi kọọrọ ya banyere ọrụ ịkụzi Baịbụl ị na-arụ. (lmd isi nke 5 nọmba nke 3)

5. N’Oge Ọzọ

(Nkeji 3) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. Gwa onye nwere mmasị na-ekwebughị ka a mụwara ya Baịbụl ka gị na ya mụwa Baịbụl. (lmd isi nke 8 nọmba nke 4)

6. Ime Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs

(Nkeji 5) Gị na onye ị na-amụrụ Baịbụl nke na-anaghị eme nke ọma kparịta ụka. (lmd isi nke 12 nọmba nke 5)

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Abụ nke 5

7. Ihe Ndị Na-eto Eto Ga-eme Ma Ọ Bụrụ na Ha Na-echegbu Onwe Ha Gafee Ókè

(Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.

Ndị na-efe Jehova na-echegbukwa onwe ha otú ndị ọzọ si echegbu onwe ha. Dị ka ihe atụ, e nwere oge dị iche iche Devid chegburu onwe ya. Otú ahụ ka ọ dịkwa ọtụtụ ụmụnna anyị n’oge a. (Ọma 13:2; 139:23) Ọ dị mwute na ndị na-eto eto na-echegbukwa onwe ha. Mgbe ụfọdụ, nchegbu nwere ike ime ka o siere ndị na-eto eto ike ime ihe ndị ha na-eme mgbe niile, dị ka ịga ụlọ akwụkwọ na ịga ọmụmụ ihe. O nwedịrị ike ime ka ezigbo ụjọ na-atụ ha ma ọ bụ ka ha chewe echiche igbu onwe ha.

Ndị na-eto eto, ọ bụrụ na e nwee mgbe unu chegbuwere onwe unu gafee ókè, gaanụ kọọrọ ya ndị mụrụ unu ma ọ bụ onye torola eto ma nke a na-akọ. Kpeekwanụ ekpere rịọ Jehova ka o nyere unu aka. (Fil. 4:6) Ọ ga-enyere unu aka. (Ọma 94:17-19; Aịza. 41:10) Ka anyị lebagodị anya n’ihe mere Steing.

Kpọnye VIDIO bụ́ Jehova Lekọtara M. Jụzie ụmụnna ajụjụ ndị a:

• Olee amaokwu Baịbụl nyeere Steing aka, oleekwa ihe mere amaokwu a ji nyere ya aka?

• Olee otú Jehova si lekọta ya?

Ndị nne na nna, unu nwere ike inyere ụmụ unu aka ka nchegbu ghara iri ha ka mmiri. Otú unu ga-esi eme ya bụ ịna-eji ndidi ege ha ntị, ịna-agwa ha na unu hụrụ ha n’anya, nakwa inyere ha aka ka obi sie ha ike na Jehova hụrụ ha n’anya. (Taị. 2:4; Jems 1:19) Tụkwasịnụ Jehova obi. Ka obi siekwa unu ike na ọ ga-eme ka unu nweta nkasi obi na ume unu ga-eji na-enyere ụmụ unu aka.

E nwere ike anyị agaghị amata mgbe onye nọ n’ọgbakọ na-echegbu onwe ya gafee ókè. E nwekwara ike anyị agaghị aghọta otú obi dị onye ahụ. Ma, anyị nwere ike inyere ya aka ma ọ bụrụ na anyị na-eme ka ahụ́ ruo mmadụ niile nọ n’ọgbakọ ala, na-emekwa ka ha mara na anyị hụrụ ha n’anya.​—Ilu 12:25; Hib. 10:24.

8. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ

Okwu Mmechi (Nkeji 3) | Abụ nke 81 na Ekpere