Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Septemba 23-29

ABỤ ỌMA 88-89

Septemba 23-29

Abụ nke 22 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

1. Ọ Bụ Ọchịchị Jehova Kacha Mma

(Nkeji 10)

Ọchịchị Jehova na-ekpe ikpe ziri ezi (Ọma 89:14; w17.06 28 ¶5)

Ọchịchị Jehova na-eme ka ndị mmadụ na-aṅụrị ọṅụ (Ọma 89:15, 16; w17.06 29 ¶10-11)

Ọchịchị Jehova ga-adịru mgbe ebighị ebi (Ọma 89:34-37; w14 10/15 10 ¶14)

Ọ bụrụ na anyị ana-eche banyere otú ọchịchị Jehova si ka nke ụmụ mmadụ mma, ọ ga-enyere anyị aka ịna-anọpụ iche ma anyị nụ ihe nwere ike ime ka anyị tinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị

2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke

(Nkeji 10)

  • Ọma 89:37​—Gịnị mere ọnwa ji bụrụ ihe dabara adaba nke na-echetara anyị na ọchịchị Kraịst ga-adịgide? (w07 7/15 32 ¶2-4)

  • Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?

3. Ọgụgụ Baịbụl

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA

4. Ịmalite Mkparịta Ụka

(Nkeji 3) IKWUSA OZI ỌMA N’EBE NDỊ MMADỤ NA-ANỌKARỊ. Gwa onye na-abụghị onye chọọchị otú anyị na ndị mmadụ si amụ Baịbụl nakwa na ị chọrọ ka gị na ya mụwa Baịbụl. (lmd isi nke 5 nọmba nke 5)

5. N’Oge Ọzọ

(Nkeji 4) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Gwa ya ka i gosi ya otú anyị na ndị mmadụ si amụ Baịbụl. (th ihe ọmụmụ nke 9)

6. Ịkọwa Ihe Ndị I Kweere

(Nkeji 5) Okwu. ijwbq 181​—Isiokwu: Gịnị Ka Baịbụl Na-ekwu? (th ihe ọmụmụ nke 2)

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Abụ nke 94

7. Iwu Jehova Kacha Mma

(Nkeji 10) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.

Ọtụtụ ndị weere ihe Baịbụl kwuru gbasara mmekọahụ na alụmdi na nwunye ka ihe mgbe ochie na ihe na-agaghị ekwe omume n’oge a. Obi ò siri gị ike na ime ihe Jehova kwuru na-akacha abara anyị uru mgbe niile?​—Aịza. 48:17, 18; Rom 12:2.

Baịbụl gwara anyị na ndị na-anaghị edebe iwu Chineke nyere gbasara omume dị mma na nke na-adịghị mma “agaghị eketa Alaeze Chineke?” (1 Kọr. 6:9, 10) Ma, ọ̀ bụ naanị ihe a mere anyị ga-eji na-edebe iwu Chineke?

Kpọnye VIDIO bụ́ Ihe Mere M Ji Kwere​—Ihe Chineke Chọrọ na Ihe Mụnwa Chọrọ. Jụzie ụmụnna ajụjụ a:

  • Olee otú iwu Chineke si echebe anyị?

8. Mkpa Ọgbakọ

(Nkeji 5)

9. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ

(Nkeji 30) rr isi nke 15 ¶1-7, vidio kọwara isiokwu a na-amụ

Okwu Mmechi (Nkeji 3) | Abụ nke 133 na Ekpere