Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịtọrọ Mmadụ—Achụmnta Ego Zuru Ụwa Ọnụ

Ịtọrọ Mmadụ—Achụmnta Ego Zuru Ụwa Ọnụ

Ịtọrọ Mmadụ—Achụmnta Ego Zuru Ụwa Ọnụ

N’IME afọ iri gara aga, ịtọrọ mmadụ amụbawo nke ukwuu gburugburu ụwa. Otu akụkọ na-ekwu na n’agbata afọ 1968 na 1982, e jichiri ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu puku mmadụ na mba 73. Ma ná ngwụsị afọ ndị 1990, kwa afọ a tọọrọ ihe e mere atụmatụ ya ịbụ malite na mmadụ 20,000 ruo 30,000.

Ịtọrọ mmadụ bụ mpụ yiri ka ọ na-ewuru ndị omempụ n’ụwa nile site na Russia ruo Philippines, n’ihi na e nwere ndị ntọ dị njikere ịnwụde ihe ọ bụla na-agagharị agagharị. N’otu oge, a tọọrọ nwa ọhụrụ dị nanị otu ụbọchị. Na Guatemala a tọọrọ otu nwanyị dị afọ 84 nọ n’oche nkwagharị ma jichie ya ruo ọnwa abụọ. Na Rio de Janeiro, ndị na-eme mpụ n’okporo ámá na-atọrọ ndị mmadụ kpọmkwem n’okporo ámá, na-ekwu mgbe ụfọdụ ka e nye ha nanị $100 dị ka ihe mgbapụta.

Ọbụna ụmụ anụmanụ eyighị ka ha nweere onwe ha. Ọtụtụ afọ gara aga, ụfọdụ ndị omempụ nwere anya ike na Thailand tọọrọ otu enyí dị tọn isii n’arọ bụ́ nke nọ na-arụ ọrụ ma kwuo ka e nye ha $1,500 dị ka ihe mgbapụta. A sịrị na òtù ndị omempụ ndị nọ na Mexico na-agba ndị batara ọhụrụ n’òtù ha ume iji anụ ndị e ji mere enyi na anụ ụlọ na-amụgharị ihe iji nweta ahụmahụ zuru ezu tupu ha ebido ezigbo ọrụ.

N’oge gara aga, ndị ntọ na-edekarị ndị bara ọgaranya, ma ụbọchị agbanweela. Otu akụkọ sitere n’aka ụlọ ọrụ mgbasa ozi bụ́ Reuters na-ekwu, sị: “A na-atọrọzi ndị mmadụ kwa ụbọchị na Guatemala, bụ́ ebe ndị mmadụ ji oké mmasị na-echeta nnọọ oge ndị gara aga mgbe ihe ka mma, mgbe ndị na-emegide ọchịchị na-ede nanị ndị ọchụ ntá ego ole na ole bara ọgaranya. Ugbu a ma ọgaranya ma ogbenye, ma nwata ma okenye, bụụrụ òtù ndị ntọ anụ oriri.”

A na-akọsakarị ntọrọ nke ndị a ma ama n’usoro mgbasa ozi n’ụzọ sara mbara, ma a na-ahụ maka ihe ka ọtụtụ ná ntọrọ ndị ọzọ n’akọsaghị ha. N’eziokwu, n’ihi ọtụtụ ihe, mba dị iche iche “enwekebeghị ihe mere ha ga-eji kpọsaa nsogbu banyere ịtọrọ mmadụ.” Isiokwu na-esonụ ga-atụle ọtụtụ n’ime ihe ndị dị otú ahụ.

[Map dị na peeji 13]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

MEXICO

Ebe a na-atọrọ ihe dị ka mmadụ 2,000 kwa afọ, a kpọwo ịtọrọ mmadụ “obere achụmnta ego.”

GREAT BRITAIN

Inshọransị maka ịtọrọ mmadụ bụ́ nke a na-agbata n’ụlọ ọrụ Lloyd’s of London ejiriwo pasent 50 mụbaa kwa afọ kemgbe 1990.

RUSSIA

Nanị n’ógbè Caucasus dị n’ebe ndịda Russia, ọnụ ọgụgụ ndị a tọọrọ mụbara site na 272 na 1996 ruo 1,500 na 1998.

PHILIPPINES

Dị ka magazin bụ́ “Asiaweek” si kwuo, “Philippines bụ ma eleghị anya ebe a kasị atọrọ mmadụ n’Esia.” Ihe karịrị òtù ndị ntọ 40 a haziri ahazi dị n’ebe ahụ.

BRAZIL

A kọrọ na ndị ntọ nọ n’ebe ahụ nwetara ijeri $1.2 n’otu afọ dị ka ego mgbapụta.

COLOMBIA

N’afọ ndị na-adịbeghị anya gara aga, a nọwo na-atọrọ ọtụtụ puku mmadụ kwa afọ. Na May 1999, ndị na-enupụrụ ọchịchị isi tọọrọ otu narị ndị parish n’oge a na-edo Mas.

[Ebe E Si Nweta Foto]

Mountain High Maps® Copyright © 1997 Digital Wisdom, Inc.