Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ Pụghị Idebe Akwụkwọ nke Ya

Ọ Pụghị Idebe Akwụkwọ nke Ya

Ọ Pụghị Idebe Akwụkwọ nke Ya

Otu onye ọchụ ntá ego degaara alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Slovenia akwụkwọ, sị:

“Ana m ekele unu maka ịdị na-ezitere m magazin Teta! na Ụlọ Nche mgbe nile. Ana m eji ha mgbe m na-eme njem, ebe ọ bụ na m na-agụ ha n’oge njem ndị ahụ nakwa mgbe m na-echere ka nzukọ achụmnta ego malite.

“M na-arịọkwa ka unu zitere m akwụkwọ ndị na-esonụ e kwuru okwu ha na magazin unu: Is There a Creator Who Cares About You?, Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?, na Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile.

“Ọ ga-amasị m inweta akwụkwọ nke ọ bụla abụọ abụọ. Nke a bụ n’ihi na mgbe ọ bụla m na-agụ otu n’ime akwụkwọ unu n’oge m na-eme njem, e nwere onye na-enwe nnọọ mmasị n’ihe m na-agụ. N’agbanyeghi eziokwu bụ́ na ọ ga-amasị m idebe ya maka ọbá akwụkwọ m, m na-enye onye ahụ nke m.”

Anyị nwere obi ike na gị onwe gị kwa ga-erite uru dị ukwuu na broshuọ ahụ mara mma nwere peji dị 32 bụ́ Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya? Akwụkwọ a na-egosi na Onye Okike anyị nwere nzube magburu onwe ya nke gaje imezu n’isi nso. Ị pụrụ inweta otu site n’idejupụta ma zite akwụkwọ a pụrụ ịdọkapụta adọkapụta dị na magazin a n’adres e dere na ya ma ọ bụ n’adres kwesịri ekwesị e depụtara na peji nke 5 na magazin a.

□ Biko gwanụ m otú m pụrụ isi nweta broshuọ a bụ́ Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Olee Otú ị Pụrụ Isi Chọta Ya? Kwuo asụsụ nke ọ bụ.

□ Biko kpọtụrụnụ m maka ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu.