Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Enyemaka Maka Ndị A Tara Ahụhụ

Enyemaka Maka Ndị A Tara Ahụhụ

Enyemaka Maka Ndị A Tara Ahụhụ

SITE N’AKA ONYE NTA AKỤKỌ TETA! NA DENMARK

“Ọ NA-ADỊ MFE ỊGBA ỌKPỤKPỤ GBAJIRI AGBAJI KARỊA ỊGWỌ ONYE NWERE OBI MGBAWA.”—Dr. Inge Genefke.

OTU nwa okoro nọ na-agbada n’otu okporo ámá dị juu n’otu obodo ukwu dị na Europe ma kwụsịtụ ikiri ngwá ahịa ụfọdụ a kpọsara na windo otu ụlọ ahịa. Na mberede, aka ya mawara jijiji. Ikpere ya amaa jijiji. O jidere aka n’olu ya dị ka a ga-asị na ihe gbadoro ya n’akpịrị. Na windo ahụ, ọ hụchatara ndị uwe ojii abụọ yi yunifọm. Ọ dịghị iwu nwa okoro ahụ dara, ọ dịghịkwa ihe mere ọ ga-eji tụọ egwu. Ma, anya nkịtị ọ hụrụ ndị uwe ojii chetaara ya otu ebe dị ọtụtụ puku kilomita site n’ebe ahụ, chetakwara ya ọtụtụ afọ gara aga mgbe a tara ya ahụhụ.

Nke a pụrụ ịbụ akụkọ nke otu n’ime ọtụtụ nde ndị ikom, ndị inyom, na ọbụna ụmụaka. Ọ pụrụ ịbụ akụkọ nke onye ị maara. Onye e mesoro ihe n’ụzọ dị oké njọ pụrụ ịbụ onye gbara ọsọ ndụ ma ọ bụ onye si mba ọzọ kwabata n’ógbè unu. Ụmụ ya na ụmụ gị pụrụ ịdị na-agakọ akwụkwọ. Ị pụrụ ịma ya dị ka onye agbata obi dị jụụ, dị nwayọọ, nwere nsọpụrụ nke na-akpapụkarị iche. Ma ọdịdị a na-ahụ anya pụrụ igosi ihe ọzọ; ha pụrụ ikpuchi enweghị obi iru ala nke onye ahụ na-enwe ka ọ na-agbalị ịnagide ahụhụ ọ tara na mkpaghasị uche ya gara aga ọ na-echeta. Ihe ọ bụla ọ hụrụ—ma ọ bụ ụda ọ bụla ọ nụrụ—pụrụ ime ka o cheta ihe ndị menyere ya ụjọ n’oge gara aga. Otu onye dị otú ahụ a tara ahụhụ na-akọwa, sị: “Mgbe ọ bụla m nụrụ ka nwa ọhụrụ na-akwa ákwá, m na-echeta ndị m nụrụ ka ha na-akwa ákwá n’ụlọ mkpọrọ. Mgbe ọ bụla m nụrụ ụda ihe na-ada ada, ana m echeta otú osisi ahụ na-ada tupu ọ kụta m n’ahụ.”

Ọ bụghị nanị ndị na-anụbigara ọchịchị ọkụ n’obi ókè na òtù ndị na-eyi ọha egwu na-ata mmadụ ahụhụ. N’ọtụtụ mba, ndị agha na ndị uwe ojii na-atakwa mmadụ ahụhụ. N’ihi gịnị? Ịta mmadụ ahụhụ pụrụ ịbụ ụzọ dị ngwa, dịkwa irè nke isi ajụpụta mmadụ ihe, eme ka mmadụ kwupụta mmehie, enweta ihe àmà a ga-eji ejide mmadụ, ma ọ bụ ụzọ isi bọọ ọ́bọ̀. Dị ka Dr. Inge Genefke nke Denmark si kwuo, bụ́ ọkachamara a ma ama n’ihe banyere ịta mmadụ ahụhụ, n’ọnọdụ ụfọdụ gọọmenti “enwetawo ikike ma mee ka ọchịchị ha dịgide site n’ịta mmadụ ahụhụ.” Otu onye a tara ahụhụ tinyere ya otú a: “Ha chọrọ ịkụda m mmụọ ka ndị ọzọ nwee ike ịhụ ihe ga-eme ha mgbe ha katọrọ gọọmenti.”

Nye ọtụtụ ndị, echiche nke ịta mmadụ ibe ha ahụhụ na-echetara ha kpọmkwem ihe mere n’Oge Ụwa Nọ n’Ìsì. E kwuwerị, na 1948 òtù Mba Ndị Dị n’Otu nakweere Nkwupụta Ụwa Nile Maka Ihe Ndị Ruuru Mmadụ, bụ́ nke na-ekwu, sị: “Ọ dịghị onye a ga-ata ahụhụ ma ọ bụ a ga-eji obi ọjọọ, afọ ịta mmiri ma ọ bụ mweda n’ala mesoo ihe ma ọ bụ nye ntaramahụhụ.” (Akụkụ Iwu nke 5) Otú ọ dị, ụfọdụ ndị ọkachamara kweere na a tawo ihe ruru pasent 35 nke ndị gbara ọsọ ndụ n’ụwa ahụhụ. N’ihi gịnị ka ịta mmadụ ahụhụ ji jupụta nnọọ ebe nile? Olee otú o si emetụta ndị mmadụ, oleekwa ihe a pụrụ ime iji nyere ha aka?

Mgbe Ọ Gasịrị

Ọ bụghị ihe ijuanya na ọtụtụ ndị a tara ahụhụ na-agbapụ n’obodo ha iji malite ndụ ọhụrụ n’ebe ọzọ. Ma ọ bụ ezie na ha anọkwaghị n’ógbè ahụ, ahụhụ ahụ—ma nke anụ ahụ ma nke mmetụta uche—na-adịgide. Dị ka ihe atụ, onye a tara ahụhụ pụrụ inwe obi amamikpe n’ihi enweghị ike ichebe ndị enyi na ndị ikwu ya pụọ ná mmeso ọjọọ. Ọ pụkwara ịmalite ịghara nnọọ ịtụkwasị mmadụ obi, na-atụ egwu na onye ọ bụla o zutere pụrụ ịgba ya àmà. “Onye a tara ahụhụ ga-abụ onye na-akpapụ iche ruo mgbe ebighị ebi,” ka Carsten Jensen na-ede akwụkwọ na-ekwu. “O nweghịkwa ntụkwasị obi n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi.”

Ihe na-esi na ya apụta bụ ngwakọta nke ahụ erughị ala na mkpaghasị uche nke pụrụ ịgbagwoju onye ahụ na onye ọ bụla nwara inyere ya aka anya. Mgbe ụfọdụ a pụrụ ịgwọta nsogbu nke anụ ahụ n’ụzọ dị mfe, ma ọ dịghị otú ahụ n’ebe nsogbu nke mmetụta uche dị. “Ná mmalite anyị chere, sị ‘Ọ dị mma, anyị ga-agwọta ha—mgbe ahụ ha pụrụ ịlawa,’” ka Dr. Genefke na-ekweta. “Ma n’oge na-adịghị anya anyị chọpụtara na ọ bụ ihe mgbu dị ha n’obi na-egbu ha.” Ka o sina dị, Dr. Genefke na-ekwu, sị: “Ọ bụ ihe ijuanya na ọ pụrụ ikwe mee ibelata ihe mgbu nke ndị a tara ahụhụ na inyere ha aka, ọbụna ma ọ bụrụ na ọtụtụ afọ agaala.”

Na 1982, n’Ụlọ Ọgwụ Mba dị na Copenhagen, Dr. Genefke na ndị dibịa ndị ọzọ bụ́ ndị Denmark guzobere otu obere ngalaba maka ịgwọ ndị gbara ọsọ ndụ bụ́ ndị a tara ahụhụ. Site n’obere mmalite a, e nwetara njikọ zuru ụwa ọnụ a na-akpọ Kansụl Mkpụzigharị Uche nke Mba Nile Maka Ndị A Tara Ahụhụ (IRCT). Site n’isi ụlọ ọrụ ya dị na Copenhagen, kansụl ahụ na-eduzi ọrụ enyemaka site n’aka ihe karịrị 100 ụlọ ọrụ n’ụwa nile. N’ime ọtụtụ afọ, kansụl ahụ amụtawo ọtụtụ ihe banyere ịgwọ ndị a tara ahụhụ.

Ụzọ Isi Nye Nkwado

Ọ na-enyekarị aka ma ndị a tara ahụhụ kọọ ahụmahụ ha. “Ihe dị ka afọ 20 gara aga,” ka mpempe akwụkwọ ihe ọmụma nke òtù IRCT na-ekwu, “ndị a tara ahụhụ na-atakarị ahụhụ n’ụzọ abụọ. Nke mbụ bụ site n’ịbụ ndị a tara ahụhụ n’ụzọ nkịtị/n’ụzọ mmetụta uche, nke abụọ buzị site n’enweghịkwa ike ikwu banyere ya.”

N’eziokwu, ọ naghị enye obi ụtọ ikwu banyere ihe na-atụ ụjọ dị ka ahụhụ a tara mmadụ. Ma ọ bụrụ na onye a tara ahụhụ achọọ ịkọrọ enyi ya, enyi ya ajụkwa ige ntị, onye ahụ a tara ahụhụ pụrụ inwekwu obi nkoropụ. N’ihi ya, ọ dị mkpa imesi onye ahụ a tara ahụhụ obi ike na ọ dị onye na-eche banyere ya. Otú ọ dị, ọ dịghị onye kwesịrị inyocha ihe dịịrị onye ọzọ. Mee elu mee ala, ọ dịịrị onye a tara ahụhụ ikpebi ma ọ̀ chọrọ ịkọrọ ya onye ọzọ, mgbe ọ ga-akọrọ ya, na onye ọ ga-achọ ịkọrọ ya.—Ilu 17:17; 1 Ndị Tesalọnaịka 5:14.

Ihe ka ọtụtụ ná ndị ọkachamara na-atụ aro ịtụle ihe metụtara ma ahụhụ nkịtị ma nke mmetụta uche a tara mmadụ. Nye ụfọdụ ndị a tara ahụhụ, ọ na-achọ enyemaka nke onye ọkachamara iji kpụzigharịa uche ha. Ụzọ isi gwọọ ya na-agụnye iku ume na nkwurịta okwu. * Ihere na-esokarị n’ihe ndị mbụ a na-elebara anya. Otu ọkachamara n’ịgwọ ọrịa gwara otu nwanyị e dinara n’ike ma tie ihe ọtụtụ ugboro, sị: “Ihere ị na-eme bụ ihe dị otú o kwesịrị na ihe kwere nghọta. Ma cheta na ọ bụghị nke gị. Ihere bụ nke ndị mere gị ihe a.”

Ndị Lanarịrị Ogige Ịta Ahụhụ

Mgbe a na-alụ Agha Ụwa nke Abụọ, e wedara ọtụtụ nde mmadụ ala n’ụzọ dị egwu n’ogige ịta ahụhụ Hitler. Ndịàmà Jehova so n’ọtụtụ puku a kpagburu n’ihi na ha jụrụ ịhapụ nkwenkwe okpukpe ha. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na okwukwe ha nyeere ha aka ịtachi obi n’ọnọdụ ndị dị otú ahụ na-eweta ọnwụnwa. N’ụzọ dị aṅaa?

Ogologo oge tupu a tụọ ha mkpọrọ, ndị Kraịst ndị a abụwo ndị ji nlezianya na-amụ Okwu Chineke. N’ihi ya, o jughị ha anya mgbe ọnwụnwa bilitere, ha ataghịkwa Chineke ụta mgbe ahụhụ ha na-akwụsịghị ozugbo ahụ. Site n’ọmụmụ Bible, Ndịàmà ahụ amatawo ihe mere Chineke ji kwere ka ajọ omume dịgide na otú ọ ga-esi kwụsị ya n’oge ọ kara aka. Ịmụ Bible emewo ka ha mata na Jehova bụ onye “na-ahụ ezi ikpe n’anya” nakwa na a na-akpasu ya iwe mgbe ụmụ mmadụ na-emeso mmadụ ibe ha ihe n’ụzọ na-adịghị mma.—Abụ Ọma 37:28; Zekaraịa 2:8, 9.

Otú ọ dị, ọtụtụ n’ime ndị a lanarịrị ogige ịta ahụhụ aghaghị ịnagide mkpaghasị uche nke ahụmahụ ọjọọ ha nwetara. Ka ha na-eme otú ahụ, e wusiwo ha ike site n’ịgbaso ndụmọdụ Pọl onyeozi. Ka Pọl nọ n’ụlọ mkpọrọ ndị Rom na-ahụsi anya, bụ́ ọnọdụ na-aghaghị ịkpataworo ya nchegbu dị ukwuu, o degaara ndị kwere ekwe ibe ya akwụkwọ, sị: “Unu echegbula onwe unu n’ihe ọ bụla; kama n’ihe nile ọ bụla site n’ekpere na arịrịọ, ya na ekele, meenụ ka Chineke mara ihe nile unu na-arịọ. Udo nke Chineke, nke kachasị uche nile, ga-echekwa obi unu na echiche uche unu nche n’ime Kraịst Jisọs.”—Ndị Filipaị 1:13; 4:6,7.

Site n’ọmụmụ Bible, ndị a na-eguzosi ike n’ezi ihe amụtawo na Chineke ekwewo nkwa ime ka ụwa ghọọ paradaịs, bụ́ ebe a ga-emesị wepụ mmetụta na-egbu mgbu nke mweda n’ala dị ka ịta mmadụ ahụhụ na-eweta.

Ndịàmà Jehova na-eso ndị agbata obi ha na-ekerịta olileanya a dabeere na Bible n’ihe karịrị ala 230. Ọnọdụ ọjọọ nke ụwa na-eme ka ha zute ọtụtụ ndị taworo ahụhụ n’ihi mmeso obi ọjọọ nke mmadụ na-emeso ibe ya. Mgbe ha zutere ndị a tara ahụhụ, Ndịàmà na-agbalị isoro ndị a kerịta nkwa Bible nke ọdịnihu dị mma. Lee obi ụtọ ha nwere ịgbasa ozi ọma banyere ọdịnihu mgbe ịta mmadụ ahụhụ ga-abụ ihe gara aga!—Aịsaịa 65:17; Mkpughe 21:4.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 15 Teta! adịghị akwado otu ụdị ọgwụgwọ. Ndị Kraịst kwesịrị ijide n’aka na ụdị ọgwụgwọ ọ bụla ha ga-agbaso emegideghị ụkpụrụ Bible.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 24]

“Ọ DỊGHỊ ONYE A GA-ATA AHỤHỤ MA Ọ BỤ A GA-EJI OBI ỌJỌỌ, AFỌ ỊTA MMIRI MA Ọ BỤ MWEDA N’ALA MESOO IHE MA Ọ BỤ NYE NTARAMAHỤHỤ.”—Akụkụ Iwu nke 5, Nkwupụta Ụwa Nile Maka Ihe Ndị Ruuru Mmadụ

[Igbe dị na peeji nke 25]

OTÚ Ị PỤRỤ ISI NYE AKA

Ọ BỤRỤ NA Ị MAARA ONYE NA-AGBAKE NÁ MMETỤTA NKE AHỤHỤ A TARA YA, ARO NDỊ NA-ESONỤ PỤRỤ INYE AKA:

● Gosi mmetụta ọmịiko. Ị pụrụ ikwu, sị: “Amaara m na e nwere nnukwu nsogbu ná mba i si bịa. Olee otú i si anagide ya?”—Matiu 7:12; Ndị Rom 15:1.

● Enyochala ya iji chọpụtachaa ihe nile ma ọ bụ na-esi nnọọ ọnwụ inyere ya aka. Kama nke ahụ nwee obiọma ma na-echebara ya echiche. Mee ka onye ahụ a tara ahụhụ mara na ị dị njikere ige ntị.—Jemes 1:19.

● Zere inyere ya aka gabiga ókè. Anapụla onye ahụ a tara ahụhụ ùgwù ya ma ọ bụ mee ka ọ ghara inwe oge ọ ga-anọrọ nke ya. Ihe ọ pụtara bụ isoro onye ahụ a tara ahụhụ, buru ibu arọ ya, ọ bụghị ịchọ ibukọrọcha ya.