Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Magazin Kasị Mma E Nwere”

“Magazin Kasị Mma E Nwere”

“Magazin Kasị Mma E Nwere”

NDỊ NCHỊKỌTA AKỤKỌ Teta! nwetara otu akwụkwọ ozi n’oge na-adịbeghị anya nke Lisel, bụ́ nwa kọleji dị afọ 18 na United States, dere. O dere, sị:

“Ana m amụ akụkọ ihe mere eme na kọleji. A chọrọ ka e mee ezigbo nnyocha maka ya, ahọrọwo m ide banyere nguzogide ziri ezi Ndịàmà Jehova guzogidere Ọchịchị Ndị Nazi na Germany n’oge Alaeze Ukwu nke Atọ. M na-arịọ ka unu nye m ndepụta nke ntụaka ndị ahụ e kwuru okwu ya ná njedebe isiokwu Teta! ahụ bụ́ ‘Ndịàmà Jehova—Ndị Nwere Obi Ike n’Agbanyeghị Ihe Ize Ndụ nke Ndị Nazi,’ bụ́ nke dị ná mbipụta nke July 8, 1998. E mere nnyocha nke ọma n’isiokwu ahụ ma jiri ezigbo arụmụka dee ya nke na ọ bụrụ na m wepụta nanị mmetụta na eziokwu dị na ya, ọ ga-abụ ihe ga-agba ezigbo àmà nye ndị ga-atụle ọrụ m.

“Ana m ekele unu maka ịnọgide na-ebipụta magazin kasị mma e nwere. Ná mbipụta nke ọ bụla, m na-ahụ ‘ihe ọmụmụ ide ihe’ nke ka ihe ọ bụla a na-akụzi n’ụlọ akwụkwọ anyị mma, nke a na-eme ka m na-achọ inwe ọganihu n’akwụkwọ nke ọ bụla m dere. Biko maranụ na m nwere ekele maka mgbalị unu.”

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 12]

Foto dị n’etiti: Państwowe Muzeum Oświęcim-Brzezinka, site n’ikike nke USHMM Photo Archives