Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mmịnye Ọbara—Arụmụka Dịteworo Aka

Mmịnye Ọbara—Arụmụka Dịteworo Aka

Mmịnye Ọbara—Arụmụka Dịteworo Aka

“Ọ bụrụ na mkpụrụ ndụ ọbara uhie bụ ọgwụ ọhụrụ taa, ọ ga-esi nnọọ ike inwetara ya akwụkwọ ikike.”—Dr. Jeffrey McCullough.

N’OGE oyi nke afọ 1667, a kpọgara otu onye ara na-akpa ike aha ya bụ Antoine Mauroy na nke Jean-Baptiste Denis, bụ́ dibịa a ma ama nke Eze Louis nke Iri na Anọ nke France. Denis nwere “ihe ngwọta” nye ara Mauroy—ịmịnye ya ọbara nwa ehi, bụ́ nke o chere ga-eme ka onye ọ na-agwọ nọrọ jụụ. Ma ihe agaraghị Mauroy nke ọma. N’eziokwu, mgbe a mịnyesịrị ya ọbara nke ugboro abụọ, ọ gbakewara. Ma n’oge na-adịghị anya ara gbawakwara onye France ahụ ọzọ, mgbe obere oge gasịrị, ọ nwụkwara.

Ọ bụ ezie na e mesịrị chọpụta na ihe gburu Mauroy n’ezie bụ nsí arsenic, nnwale Denis ji ọbara anụmanụ mee kpalitere arụmụka kpụ ọkụ n’ọnụ na France. N’ikpeazụ, na 1670, a machibidoro usoro ọgwụgwọ ahụ iwu. Ka oge na-aga, Nzukọ Ndị Isi nke England na ọbụna popu mekwara otú ahụ. Mmịnye ọbara nyụrụ ka ọkụ ruo afọ 150 sochirinụ.

Ihe Ize Ndụ Ndị Mbụ

Na narị afọ nke 19, mmịnye ọbara lọghachiri. Onye bụ́ isi ná mweghachi ahụ bụ onye England bụ́ ọkachamara n’ihe banyere ịmụ nwa nke aha ya bụ James Blundell. Site n’iji usoro ka mma na ngwá ọrụ ya ndị bụ́ ọkpọka eme ihe—na isi ọnwụ na e kwesịrị ịmịnye nanị ọbara mmadụ—Blundell mere ka a marakwa ọzọ banyere mmịnye ọbara.

Ma na 1873, F. Gesellius, onye Poland bụ́ dọkịta, dọlara mweghachi nke mmịnye ọbara azụ n’ihi ihe na-emenye egwu ọ chọpụtara: Ihe karịrị ọkara nke mmịnye ọbara e mere kpatara ọnwụ. Ozugbo ha nụrụ nke a, ndị dibịa a ma ama malitere ịkatọ usoro ahụ. Iwu ewu nke mmịnye ọbara belatakwara ọzọ.

Mgbe ahụ, na 1878, onye dibịa France bụ́ Georges Hayem mepụtaziri saline solution, bụ́ nke o kwuru na ọ pụrụ ịnọchite anya ọbara. N’adịghị ka ọbara, saline solution adịghị ihe ọjọọ ọ na-akpata, ọ dịghị akpụkọ akpụkọ, ọ dịkwa mfe ibugharị ya ebugharị. N’ụzọ kwere nghọta, a malitere iji saline solution nke Hayem mepụtara na-eme ihe n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu. Otú ọ dị, n’oge na-adịghị anya, ọ bụ ihe ijuanya na a malitere ịkwado mmịnye ọbara ọzọ. N’ihi gịnị?

Na 1900, onye Austria bụ́ ọkà n’ịkọwa ihe banyere ọrịa bụ́ Karl Landsteiner chọpụtara na e nwere ụdị ọbara dị iche iche, ọ chọpụtakwara na otu ụdị ọbara na ọzọ adịghị ekwekọcha. Ka a sịkwa ihe mere ọtụtụ mmịnye ọbara ndị e mere n’oge gara aga ji kpata ọdachi! Ugbu a, a pụrụ ịgbanwe nke ahụ, nanị site n’ịhụ na ụdị ọbara nke onye ga-enye enye kwekọrọ na nke onye a ga-enye ya. N’ịmara nke a, ndị dibịa maliteghachiri ịtụkwasị obi ná mmịnye ọbara—kpọmkwem tupu Agha Ụwa Mbụ.

Mmịnye Ọbara na Agha

N’oge a na-alụ Agha Ụwa Mbụ, a mịnyere ndị soja e merụrụ ahụ ọbara n’ajụghị ase. Otú ọ dị, ọbara na-akpụkọ ngwa ngwa, n’oge gara aga ọ gaara abụ ihe na-agaghị ekwe omume ibuga ya n’ọgbọ agha. Ma ná mmalite narị afọ nke 20, Dr. Richard Lewisohn, nke Ụlọ Ọgwụ Mount Sinai dị na New York City, jiri ihe na-akwụsị mkpụkọ ọbara bụ́ nke a na-akpọ sodium citrate mee nnwale gara nke ọma. Ndị dọkịta ụfọdụ lere ọganihu a na-akpali akpali anya dị ka ọrụ ebube. “Ọ fọrọ nke nta ka o yie ka e mewo ka anyanwụ kwụrụ otu ebe,” ka Dr. Bertram M. Bernheim, bụ́ onye dibịa a ma ama n’oge ya, dere.

Agha Ụwa nke Abụọ mere ka e nwee mmụba nke ọchịchọ a na-achọ ọbara. A mapawajuru akwụkwọ ịma ọkwa ndị e dere okwu ndị dị ka “Nye Ọbara Ugbu A,” “Ọbara Gị Pụrụ Ịzọpụta Ya,” na “O Nyere Ọbara Ya. Ị̀ Ga-enye nke Gị?,” n’ebe ọha na eze ga-ahụ ha. Ọchịchọ a na-achọ ọbara nwetara nzaghachi dị mma. Mgbe a na-alụ Agha Ụwa nke Abụọ, e nyere ihe dị ka unit 13,000,000 nke ọbara na United States. E mere atụmatụ na na London e nwetara ma kesaa ihe karịrị lita 260,000. Otú ọ dị, mmịnye ọbara nwere ọtụtụ ihe ize ndụ nye ahụ ike, dị ka ọ bịara doo anya n’oge na-adịghị anya.

Ọrịa A Na-ebute n’Ọbara

Mgbe Agha Ụwa nke Abụọ gasịrị, nnukwu ọganihu e nwere n’ịgwọ ọrịa mere ka e nwee ike inwe ịwa ahu ụfọdụ ndị a na-apụghị ichetụ n’echiche n’oge gara aga. N’ihi ya, a malitere achụmnta ego zuru ụwa ọnụ nke e si na ya enweta ọtụtụ ijeri dollar kwa afọ iji nye ọbara a ga-amịnyere ndị mmadụ, bụ́ nke ndị dibịa malitere ile anya dị ka usoro ịwa ahụ bụ́ ọkpọka.

Otú ọ dị, n’oge na-adịghị anya, a malitere inwe nchegbu banyere ọrịa mmịnye ọbara na-akpata. Dị ka ihe atụ, n’oge a na-alụ Agha Korea, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ pasent 22 nke ndị a mịnyere mmiri ọbara butere ịba ọcha n’anya—ihe fọrọ nke nta ka o jiri okpukpu atọ karịa ọnụ ọgụgụ ndị butere ya mgbe a na-alụ Agha Ụwa nke Abụọ. Ka ọ na-erule n’afọ ndị 1970, Ụlọ Ọrụ Maka Nchịkwa Ọrịa nke United States mere atụmatụ na ndị ịba ọcha n’anya e butere ná mmịnye ọbara na-egbu kwa afọ bụ 3,500. Ndị ọzọ mere atụmatụ ọnụ ọgụgụ karịrị nke a okpukpu iri.

N’ihi inyocha ọbara nke ọma karị na ijikwu nlezianya ahọrọ ndị ga-enye ọbara, ọnụ ọgụgụ ndị na-ebute ịba ọcha n’anya nke B dalatara. Ma ụdị nje virus ọhụrụ, nke na-egbukwa egbu mgbe ụfọdụ—ịba ọcha n’anya nke C—kpataziri oké mbibi. E mere atụmatụ na nde ndị America anọ butere nje virus ahụ, ọtụtụ narị puku n’ime ha bụ site ná mmịnye ọbara. N’eziokwu, nnyocha e mere nke ọma mesịrị belata njupụta nke ịba ọcha n’anya nke C. Ma, ụfọdụ na-atụ egwu na nsogbu ndị ọhụrụ ga-ebilite nakwa na ọ ga-edo anya nanị mgbe oge gafeworo.

Akụkọ Ọjọọ Ọzọ: Ọbara Bu Nje HIV

N’afọ ndị 1980, a chọpụtara na HIV pụrụ ịdị n’ọbara, bụ́ nje virus na-akpata ọrịa AIDS. Na mbụ, ndị na-edebe ọbara achọghịdị ichewa echiche na ọbara ha chekwara pụrụ ibu nje. Ọtụtụ n’ime ha nweburu obi abụọ n’ihe banyere iyi egwu nke nje HIV. Dị ka Dr. Bruce Evatt si kwuo, “ọ dị ka o nwere onye si n’ọzara gara pụta ma kwuo sị, ‘Ahụrụ m ihe si n’ụwa ọzọ.’ Ha gere ya ntị, ma ha ekwetaghị.”

Ka o sina dị, ọtụtụ mba enwewo ntiwapụ nke akụkọ ọjọọ ndị na-ekpughe na e nwere ọbara ndị bu nje HIV. A na-eme atụmatụ na agbata mmadu 6,000 na 8,000 na France butere nje HIV site n’ọbara a mịnyere ha n’agbata afọ 1982 na 1985. Ọ bụ mmịnye ọbara kpatara pasent 10 nke nje HIV ndị e butere n’Africa nile nakwa pasent 40 nke ndị na-arịa AIDS na Pakistan. Taa, n’ihi nnyocha ọbara ka mma, ibufe nje HIV site ná mmịnye ọbara na-esi ike ná mba ndị mepere emepe. Otú ọ dị, ụdị mbufe ahụ nọgidere na-abụ nsogbu ná mba ndị na-emepe emepe bụ́ ndị na-enweghị usoro nnyocha.

N’ụzọ kwere nghọta, n’afọ ndị a e nwewo mmụba ná mmasị e nwere n’ịgwọ ọrịa na ịwa ahụ n’ejighị ọbara. Ma nke a ọ̀ bụ usoro ọgwụgwọ na-adịghị ize ndụ a pụrụ iji dochie anya ọbara?

[Igbe dị na peeji nke 6]

Mmịnye Ọbara—E Nweghị Ụkpụrụ Nkà Ọgwụ Maka Iji Ya Eme Ihe

Kwa afọ na United States nanị, a na-amịnyere ndị ọrịa dị 3,000,000 ihe karịrị unit ọbara 11,000,000. N’ihi na ọnụ ọgụgụ ahụ dị ukwuu, mmadụ pụrụ iche na ndị dibịa nwere ụkpụrụ ha na-aghaghị ịgbaso ma a bịa n’ihe banyere mmịnye ọbara. Ma, The New England Journal of Medicine na-ekwu na ọ na-eju anya na e nwere ihe ọmụma dị nta “iduzi mkpebi ndị a na-eme banyere mmịnye ọbara.” N’ezie, e nwere ndịrịta iche dị ukwuu n’otú e si eji ya eme ihe, ọ bụghị nanị kpọmkwem n’ihe banyere ihe a ga-amịnye na otú ọ ga-aha kamakwa n’ihe banyere ma à ga-amịnyedị ọbara amịnye. “Ọ bụ dọkịta na-ekpebi ma à ga-amịnye ọbara ma ọ bụ na a gaghị amịnye, ọ bụghị onye ọrịa,” ka akwụkwọ ahụ ike bụ́ Acta Anæsthesiologica Belgica na-ekwu. N’ịtụle ihe ahụ dị n’elu, ọ bụghị ihe ijuanya na otu nnyocha e bipụtara na The New England Journal of Medicine chọpụtara na “a na-eme ihe e mere atụmatụ ya ịbụ pasent 66 nke mmịnye ọbara n’ụzọ na-ekwesịghị ekwesị.”

[Foto ndị dị na peeji nke 5]

N’oge Agha Ụwa nke Abụọ e nwere mmụba nke ọchịchọ a na-achọ ọbara

[Ebe E Sigasị Nweta Foto]

Imperial War Museum, London

Foto U.S. National Archives