Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Malitere Nkà Ọgwụ

Ndị Malitere Nkà Ọgwụ

Ndị Malitere Nkà Ọgwụ

MGBE José dị afọ 61, bụ́ onye Belgium si n’obodo nta Oupeye, a gwara ya na ọ ga-adị mkpa ka e dochie imeju ya. “Ọ bụ ihe kasị wụọ m akpata oyi ná ndụ m,” ka o kwuru. Nanị iri afọ anọ gara aga, a pụghị ichetụ n’echiche idochi imeju mmadụ. Ọbụna n’afọ ndị 1970, ọnụ ọgụgụ ndị na-anwụghị n’ihi ya bụ nanị ihe dị ka pasent 30. Otú ọ dị, taa, idochi imeju mmadụ bụ ihe a na-eme ọtụtụ mgbe, ọ na-agakwa nnọọ nke ọma.

Ma a ka nwere nnukwu nsogbu. Ebe ọ bụ na a na-enwekarị oké ọbara ọgbụgba mgbe a na-edochi imeju mmadụ, ndị dọkịta na-amịnyekarị ndị mmadụ ọbara n’oge ha na-awa ha ahụ. N’ihi nkwenkwe okpukpe ya, José achọghị ọbara. Ma ọ chọrọ ka e dochie imeju ya. Ọ̀ bụ ihe a na-apụghị ime eme? Ụfọdụ ndị pụrụ iche otú ahụ. Ma onyeisi ndị dọkịta ahụ na-awa ahụ chere na ya na ndị òtù ya nwetụrụ ohere inwe ihe ịga nke ọma n’ịwa ya ahụ n’ejighị ọbara. Nke ahụ bụkwa kpọmkwem ihe ha mere! Nanị ụbọchị 25 mgbe a wasịrị ya ahụ, José laghachiri n’ụlọ ya, ya na nwunye ya na nwa ha nwanyị. *

N’ihi nkà nke ndị ahụ magazin Time kpọrọ “ndị dike na nkà ịgwọ ọrịa,” a na-agwọkarị ọrịa ma na-awa ahụ ugbu a n’ejighị ọbara karịa mgbe ọ bụla ọzọ. Ma n’ihi gịnị ka e ji na-achọ ya otú ahụ? Iji zaa ajụjụ ahụ, ka anyị tụlee akụkọ banyere mmịnye ọbara, bụ́ nke jupụtara ná nsogbu.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Ndịàmà Jehova na-ele idochi akụkụ ahụ mmadụ anya dị ka ihe mmadụ ga-eji akọ na uche ya kpebie.

[Foto dị na peeji nke 3]

N’ụwa nile, e nwere ugbu a ihe karịrị ndị dọkịta 90,000 meworo ka a mara na ha dị njikere ịgwọ Ndịàmà Jehova n’ejighị ọbara