Ube Bekee—Mkpụrụ Osisi E Ji Eme Ọtụtụ Ihe n’Ezie!
Ube Bekee—Mkpụrụ Osisi E Ji Eme Ọtụtụ Ihe n’Ezie!
Site n’aka onye nta akụkọ Teta! na Colombia
NDỊ Spain meriri n’agha ná mmalite narị afọ nke 16 ahụtụbeghị ihe dị ka ya. O butụrụ ibu, ma ọ na-anọgide na-acha akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ ọbụna ma o ruo. Ime ya na-adị nro dị nnọọ ka bọta, ọ na-atọtụkwa ka akị.
Onye mere ka ndị Europe mara ube bekee na nke mbụ ya na 1519 bụ Martín Fernández de Enciso. Enciso hụrụ mkpụrụ osisi ahụ na nso ebe a na-akpọ́ Santa Marta, Colombia ugbu a, n’oge ndị Spain mere otu n’ime njem ndị mbụ ha mere gaa Ebe Ndịda America. N’afọ ndị ahụ e mere njem nchọpụta, ndị Europe buru ụzọ detụ ọtụtụ ihe oriri ọhụrụ ọnụ ma e wezụga ube bekee, gụnyere chocolate, ọka, na ji nwannu.
Otú ọ dị, ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ihe oriri ndị ahụ bụ nke ọhụrụ n’ezie. Ndị bi n’ebe ndị na-atụ oyi n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa eri ọtụtụ narị afọ maara ha nile ma na-erikwa ha. Ụfọdụ agbụrụ nọ n’ebe ahụ ji ube bekee akpọrọ oké ihe nke na ha na-enye ya dị ka onyinye agbamakwụkwọ, na-ejikwa ya emere ndị ọbịa ọjị.
Inwe Ube Bekee
Taa, a na-adọ ube bekee n’ọtụtụ ebe na-ekpo ọkụ ma ọ bụ na-ajụ oyi, gụnyere Australia, Israel, Kenya, New Zealand, Ebe Ugwu na Ebe Ndịda America, nakwa na Philippines. Ọ bụ otu n’ime ihe dị ka mkpụrụ osisi 20 a na-ahụ n’ebe okpomọkụ bụ ndị na-aga ahịa n’ụwa nile.
Otú ọ dị, e nwere ọtụtụ ụdị ube bekee n’ala ndị na-ekpo ọkụ dị na Kọntinent ndị dị n’America, bụ́ ndị ụfọdụ n’ime ha na àkwá ha nhata ebe ndị ọzọ bururu ibu ka ogbe egusi na-ebuchaghị ibu, na-adị ihe ruru kilogram abụọ n’arọ. Ụcha ha pụrụ ịdịgasị iche site n’akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ ruo n’ezigbo odo odo, mkpo nke ụdị ụfọdụ anaghị adị mụrụmụrụ ma na-adị peke peke, ebe nke ụdị ndị ọzọ anaghị ebu ibu ma dị mụrụmụrụ. Otú
ọ dị, ọ dị mfe inwe ubi na-amịpụta otu ụdị ube bekee.Mgbe ọ na-ama ifuru, ọtụtụ puku okooko osisi na-achatụ odo odo na-ejupụta n’elu osisi ube bekee. Otú ọ dị, ọ bụ nanị 1 n’ime 5,000 nke okooko osisi ndị a ga-aghọ ube bekee. Njimara pụrụ iche nke okooko osisi ndị a bụ na nke ọ bụla n’ime ha na-enwe ntụ okooko osisi na-ewepụta ihe o ji amị mkpụrụ, n’otu oge ahụ, nweekwa akụkụ na-emepụta ihe yiri àkwá. Nke a pụrụ ime ka ha jikọta wee mịpụta mkpụrụ n’onwe ha ma e wezụga otu ihe dị ịtụnanya dị n’osisi ube bekee nke na-eme ka ha na-arụ ọrụ n’oge dịcha iche.
N’ihi ya, osisi ube bekee ụfọdụ na-emeghe okooko osisi ha n’oge anwụ ụtụtụ iji nweta ihe ha ji amị mkpụrụ ma pịachie okooko osisi ahụ n’ehihie. Okooko osisi ndị a na-emeghezi ọzọ dị ka ndị ga-ewepụta ihe ha ji amị mkpụrụ ná mgbede. Osisi ndị ọzọ dị n’ógbè ahụ ga-eme nke ha n’oge dị iche. Njikọta iji mia mkpụrụ na-ewere ọnọdụ mgbe otu osisi nke na-ewepụta ihe o ji amị mkpụrụ dịdewere nke na-anabata n’otu oge ahu ihe o ji amị mkpụrụ. Ọzọkwa, aṅụ na ahụhụ ndị ọzọ dị mkpa iji bufee ihe ahụ o ji amị mkpụrụ. N’ihi ya, njikọ dị mgbagwoju anya nke ìhè anyanwụ, okpomọkụ, ahụhụ, ifufe, na ógbè ebe ọ dị na-eme ka o kwe omume ịmịpụta mkpụrụ a.
Ọ Na-enye Ihe n’Ahụ ma Baa Uru
Ube bekee na-enye nnọọ ihe n’ahụ, n’ihi na o nwere protein, riboflavin, niacin, potassium, na vitamin C n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu. A sịrị na o nwere ma ọ dịkarịa ala vitamin 11 na mineral 14. N’akụkụ ụfọdụ nke Ebe Etiti Kọntinent America, a na-ewere ube bekee na pankeeki e ji ọka mee dị ka ihe oriri na-eju afọ. Ube bekee nwekwara abụba dị ukwuu, mmanụ ya yikwara mmanụ olive n’ihi na o nwere abụba dị ukwuu. A na-ejikwa mmanụ ya eme ncha na ihe ntecha.
Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ akụkụ nile nke osisi ube bekee bachara uru. A na-eji nkụ ya emenwu ọkụ. N’Ebe Ndịda America, a na-eji mkpụrụ ya akanye akara n’ákwà, ebe ọ bụ na ọ naghị ehichapụ ehichapụ. N’ebe ụfọdụ na Philippines, a na-eji akwụkwọ ya eme tii. A sịrị na a pụrụ iji mkpo osisi ya eteji akpụkpọ anụ.
Ịzụta na Iracha Ube Bekee
Ọ bụrụ na ị gaa ahịa ịzụ ube bekee, anwala anwa iche na otú mkpo ya na-acha ga-egosi gị ma ò ruola, ebe nke a na-adịgasị iche site n’otu ụdị gaa n’ọzọ. Gbalịa ịpịtụ mkpụrụ osisi ahụ aka. Ọ bụrụ na ọ dịtụ nro, o ruola. E kwesịrị idebe ube bekee n’ebe ndị na-ekpo ọkụ, ikuku na-abata nke ọma, ị pụkwara inyetụ aka mee ka o ruo site n’iji akwụkwọ fụchie ya. A pụkwara idebe ha na friji, ọbụna mgbe e bewasịrị ha. Site n’ifesa mmiri lemọn n’akụkụ ahụ ghere oghe, ị pụrụ ime ka ọ ghara ịgbaji.
Ọ na-amasị ọtụtụ ndị iji oroma na tomato eri ube bekee. A pụrụ iji ihe na-agba agba na nti wepụtakwuo ụtọ ya. Ọzọkwa, ube bekee na-adị mma ma e jiri ya taa oporo, nshịkọ, ma ọ bụ oporo ukwu, ube bekee pụkwara ịba uru n’ọtụtụ ụdị salad. Ụfọdụ ndị na-agwakọta ya na mkpụrụ osisi ndị ọzọ iji mee ihe ọṅụṅụ na-atọ ụtọ.
Mgbe a kwọkọtara ube bekee na ihe ndị e ji ewepụta ụtọ nri na ihe ndị ọzọ, ọ na-aghọ ihe a pụrụ ite n’elu bred. Otú ọ dị, ihe a na-agaghị eleghara anya bụ guacamole a ma ama, bụ́ nke a na-eji ube bekee, tomato, yabasị, ose ndụ, na ihe ndị e ji ewepụta ụtọ nri eme. A pụkwara iji mkpụrụ osisi ahụ rie ihe oriri e siri esi, dị ka akụkụ nke ihe oriri ahụ. Ya bụrụ otú ahụ, o kwesịrị ịbụ ihe ikpeazụ a ga-etinye, mgbe nri ahụ jụsịrị oyi.
Ikekwe, tupu ugbu a ube bekee na-adịkarị n’ihe oriri gị. Otú ọ dị, n’akụkụ ụfọdụ nke ụwa, a pụrụ iwere ya dị ka mkpụrụ osisi a na-adịghị ahụkebe na nke dị ụkọ. Ọ bụrụ na i detụbeghị ube bekee ọnụ, gịnị ma i mee otú ahụ oge ọzọ o ruru gị aka. Ị pụrụ ịchọpụta na mkpụrụ osisi a e ji eme ọtụtụ ihe n’ezie na-atọkwa ụtọ!