Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

(A pụrụ ịchọta azịza nye ajụjụ ndị a n’akụkụ Bible ndị a kpọtụrụ uche, e bipụtakwara ndepụta zuru ezu nke azịza na peji nke 28. Maka inwetakwu ihe ọmụma, lee mbipụta bụ́ “Insight on the Scriptures,” nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.)

1. Gịnị ka Jisọs na-ekwukarị iji mee ka ndị na-ege ya ntị mara na ihe ọ na-ekwu ziri ezi? (Matiu 5:18)

2. Banyere ole ndị ka e kwuru, sị: “Onye kachasị nta ha ka [otu narị] ndị ikom, onye kachasị ukwuu hakwa ka [otu puku]”? (1 Ihe E Mere 12:8-14)

3. Aha ònye ka ndị dike na-alụrụ Devid ọgụ a na-akpọ Joab, Abishaị, na Asahel na-azakarị? (2 Samuel 2:18)

4. Ọ bụ ezie na a pụrụ ịkpọ mmadụ asị n’ihi aha ya, gịnị ka Jisọs kwuru na mmadụ aghaghị ime iji bụrụ onye a ga-azọpụta? (Mak 13:13)

5. Ụmụ ndị ikom ole ka Heman nwere, bụ́ ndị e gbuchara n’ihi obi ọjọọ ya n’ebe ndị Juu nọ? (Esta 9:10)

6. Ụdị mmụọ e kere eke dị aṅaa weere nkume dị ọkụ metụ egbugbere ọnụ Aịsaịa ka Aịsaịa wee nwee ike ịrụ ọrụ amụma ya? (Aịsaịa 6:6)

7. Ònye ka Herọd “tinyere ihe ya n’aka,” bụ́ onye nwunye ya, bụ́ Joana, jeere Jisọs ozi? (Luk 8:3)

8. Ọnọdụ ibu ọrụ dị aṅaa ka Pọl na-agba ndị ikom nọ n’ọgbakọ ume iru eru maka ya? (1 Timoti 3:1)

9. Gịnị bụ aha osimiri anọ ndị ahụ isi ha dị ‘n’osimiri na-esi n’Iden apụta’? (Jenesis 2:10-14)

10. Pọl kọwara na ihe iko achịcha dị nta pụrụ ime gịnị? (Ndị Galetia 5:9)

11. Gịnị bụ aha ụmụ ndị ikom atọ Noa, ndị ‘ụwa nile si n’aka ha gbasaa’? (Jenesis 9:18, 19)

12. Ònye bụ nna Samuel onye amụma? (1 Samuel 1:19, 20)

13. Gburugburu obodo ukwuu dị aṅaa nke a na-anọ na ya elepụ anya na Ndagwurugwu Jezreel ka a nọ lụọ ọtụtụ agha ndị bụ onye merie ọ laa? (Ndị Ikpe 5:19)

14. N’ịbụ ndị sitere n’aghụghọ ha gbanahụ ọnwụ, ọrụ dị aṅaa ka e kenyere ndị Gibeọn? (Joshua 9:27)

15. Gịnị ka a na-akpọ ndị na-eso ụzọ 12 ahụ Jisọs jiri aka ya họpụta? (Matiu 10:2)

16. Olee utu aha ndị e ji mara nanị Jisọs bụ́ ndị ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya na e kwesịghị ịkpọ ha? (Matiu 23:8, 10)

17. Olee mba Pọl nọ na ya dee akwụkwọ Ndị Hibru? (Ndị Hibru 13:24)

18. Nkebi okwu dị aṅaa ka Job ji kwuo na ya anwụchaala anwụọ? (Job 19:20)

19. N’oge ochie, olee ebe a na-anọ ahọchapụta ókpòrò na igbogbo dị n’ọka? (Rut 3:3)

20. N’ihi gịnị ka ụmụnne Josef ji kpọ ya asị? (Jenesis 37:3-11)

Azịza Nye Ajụjụ

1. “N’ezie asị m unu”

2. Ndị dike na-eme ngwa ngwa, nwere obi ike si n’ebo Gad, bụ́ ndị sonyeere Devid n’ọzara mgbe ọ ka nọ n’ebe o zoro n’ihi Eze Sọl

3. Nne ha, bụ́ Zeruaịa

4. Ịtachi obi ruo ọgwụgwụ ihe nile

5. Iri

6. Seraph

7. Kuza

8. “Ọnọdụ onye na-elekọta nzụkọ Kraịst anya”

9. Paịshọn, Gaịhọn, Hidekel, na Yufretis

10. Iko ogbe ụtụ ọka a gwọrọ agwọ dum

11. Shem, Ham, na Jefet

12. Elkena

13. Megido

14. Ha ghọọrọ “nzukọ Israel nile na ebe ịchụàjà Jehova ndị ọwa nkụ na ndị ose mmiri”

15. Ndị ozi

16. Rabaị na Onye Ndú

17. Itali

18. “M wee were akpụkpọ ezé m wepụga onwe m”

19. N’ebe nzọcha ọka

20. N’ihi na nna ya hụrụ ya n’anya karị nakwa n’ihi nrọ ndị ọ rọrọ