Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịgha Ụgha—Ọ̀ Dị Mgbe Ọ Pụrụ Ịbụ Ihe Ziri Ezi?

Ịgha Ụgha—Ọ̀ Dị Mgbe Ọ Pụrụ Ịbụ Ihe Ziri Ezi?

Echiche nke Bible

Ịgha Ụgha—Ọ̀ Dị Mgbe Ọ Pụrụ Ịbụ Ihe Ziri Ezi?

“MGBE ỤFỌDỤ IKWU IHE NA-ABỤCHAGHỊ IHE MERE EME NA-EME KA E ZERE INYE OGOLOGO NKỌWA.”

OKWU a na-egosi otú ọtụtụ ndị si ele ịgha ụgha anya. Ha na-akọwa na ịgha ụgha adịghị njọ ma ọ bụrụ na ọ dịghị onye e ji ya megide. Echiche dị otú ahụ nwere ọbụna aha ndị gụrụ akwụkwọ nyere ya—omume na-enweghị ụkpụrụ, bụ́ nke na-egosi na iwu dị mkpa ka mmadụ gbasoo bụ nanị iwu ahụ a sị na ọ bụ nke ịhụnanya. Ikwu ya n’ụzọ ọzọ, Diane Komp na-ede akwụkwọ na-akọwa, sị: “Ọ bụrụ na nzube gị ziri ezi, obi gị eziekwa ezi (mgbe ahụ) eziokwu ahụ bụ́ na ị ghara ụgha . . . enweghị ihe o mere.”

A na-enwekarị echiche dị otú ahụ n’ụwa taa. Akụkọ ọjọọ ndị metụtara ụgha nke ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ndị ndú ụwa ndị ọzọ a ma ama ghara, awụwo ọha mmadụ akpata oyi n’ahụ. N’ịbụ ndị ọnọdụ a na-emetụta, ọtụtụ ndị adịghịzi eji ikwu eziokwu akpọrọ ihe. N’ihe omume ụfọdụ ịgha ụgha aghọwo ọbụna ụkpụrụ a na-akwado. “A na-akwụ m ụgwọ ka m na-agha ụgha. Ana m emeri n’asọmpi ire ahịa ma na-enweta ịja mma kwa afọ ma ọ bụrụ na m ghaa ụgha. . . . Nke a yiri ka ọ bụ ọzụzụ bụ́ isi a na-enye maka ire ahịa n’ebe nile,” ka otu odeakwụkwọ na-arụ ọrụ n’ebe a na-ere ihe na-ekpesa. Ọtụtụ ndị kwere na ọ dịghị ihe ọjọọ dị n’ịgha ụgha ndị e weere na ha abụghị maka imegide mmadụ. Nke a ọ̀ bụ eziokwu? Ọ̀ dị mgbe ọ pụrụ izi ezi ka onye Kraịst ghaa ụgha?

Ụkpụrụ Dị Elu nke Bible

Bible na-akatọ ụdị ịgha ụgha nile n’ezoghị ọnụ. “[Chineke] ga-eme ka ndị nile na-ekwu okwu ụgha laa n’iyi,” ka ọbụ abụ ahụ na-ekwu. (Abụ Ọma 5:6; lee Mkpughe 22:15.) N’Ilu 6:16-19, Bible na-edepụta ihe asaa Jehova kpọrọ asị. “Ire okwu ụgha” na “onye àmà okwu ụgha nke na-ekupụ okwu ụgha dị iche iche dị ka ume” bụ ihe ndị pụtara ìhè dị ná ndepụta ahụ. N’ihi gịnị? N’ihi na Jehova kpọrọ ihe ọjọọ ịgha ụgha na-akpata asị. Nke ahụ bụ otu ihe mere Jisọs ji kpọọ Setan onye ụgha na ogbu mmadụ. Ụgha ndị ọ ghara mikpuru ihe a kpọrọ mmadụ ná nhụsianya na ọnwụ.—Jenesis 3:4, 5; Jọn 8:44; Ndị Rom 5:12.

Ihe mere Ananaịas na Safaịra na-eme nnọọ ka anya ọjọọ Jehova na-ele ịgha ụgha pụta ìhè. Mmadụ abụọ a kpachaara anya ghaara ndị ozi ụgha ná mgbalị doro anya nke ime ka o yie ka ha na-emesapụ aka karịa otú ha na-eme n’ezie. Ha ma ụma mee ihe ha mere. Ya mere Pita onyeozi kwuru, sị: “Ọ bụghị mmadụ ka [unu] gwara okwu ụgha, kama ọ bụ Chineke.” N’ihi nke a, Chineke gburu ha abụọ.—Ọrụ 5:1-10.

Mgbe ọtụtụ afọ gasịrị Pọl onyeozi dụrụ ndị Kraịst ọdụ, sị: “Unu ekwula okwu ụgha gwarịta ibe unu.” (Ndị Kọlọsi 3:9) Ndụmọdụ a dị mkpa karịsịa n’ọgbakọ ndị Kraịst. Jisọs kwuru na ịhụnanya nke ụkpụrụ na-eduzi ga-abụ akara a ga-eji mara ezi ndị na-eso ụzọ ya. (Jọn 13:34, 35) Ụdị ịhụnanya ahụ na-abụghị nke ihu abụọ pụrụ isi ike nanị n’ebe e nwere ezigbo obi eziokwu na ntụkwasị obi. O siri ike ịhụ mmadụ n’anya ma ọ bụrụ na anyị apụghị inwe obi ike na ọ ga na-agwa anyị eziokwu mgbe nile.

Ọ bụ ezie na ịgha ụgha nile ezighị ezi, ụgha ụfọdụ jọkarịrị ndị ọzọ ná njọ. Dị ka ihe atụ, mmadụ pụrụ ịgha ụgha n’ihi mmechuihu ma ọ bụ egwu. Onye ọzọ pụrụ iji obi ọjọọ na-agha ụgha mgbe nile ná nzube nke ime ihe ọjọọ. N’ihi ebumnobi ọjọọ o nwere, ụdị onye ahụ na-ama ụma agha ụgha bụ ihe ize ndụ nye ndị ọzọ, a ga-achụpụkwa ya n’ọgbakọ ma ọ bụrụ na o chegharịghị. Ebe ọ bụ na ọ bụghị obi ọjọọ na-akpata ịgha ụgha nile, a ghaghị ilezi anya ka a ghara ime nkatọ n’ụzọ na-ekwesịghị ekwesị kama nke ahụ ka e jide n’aka na a maara ihe nile merenụ mgbe mmadụ ghara ụgha. E kwesịrị ịtụle ebumnobi na ihe ngọpụ.—Jemes 2:13.

‘Nwee Uche Dị Ka Agwọ

Otú ọ dị, ikwu eziokwu apụtaghị na iwu ji anyị ikpughere onye ọ bụla jụrụ anyị ajụjụ ihe nile. ‘Unu enyela nkịta ihe dị nsọ, unu atụdakwala pearl unu n’ihu ezì, ka ha ghara . . . ichigharị, dọkaa unu,’ ka Jisọs dụrụ ọdụ ya na Matiu 7:6. Dị ka ihe atụ, e nwere ike ghara ịgwa ndị nwere nzube ọjọọ ihe ụfọdụ. Ndị Kraịst maara na ha bi n’ụwa obi ọjọọ. Ya mere, Jisọs nyere ndị na-eso ụzọ ya ndụmọdụ ka ha ‘nwee uche dị ka agwọ’ ma nọgide na-abụ ndị ‘na-adịghị aghụghọ dị ka nduru.’ (Matiu 10:16; Jọn 15:19) Jisọs ekwupụtachaghị ihe nile merenụ mgbe nile, karịsịa mgbe ikwu ihe nile merenụ pụrụ iwetara ya ma ọ bụ ndị na-eso ụzọ ya nsogbu na-ekwesịghị ekwesị. Ma, ọbụna n’oge ndị dị otú ahụ, ọ ghaghị ụgha. Kama nke ahụ, ọ họọrọ ịgbachi nkịtị ma ọ bụ chee mkparịta ụka ahụ ihu n’ebe ọzọ.—Matiu 15:1-6; 21:23-27; Jọn 7:3-10.

N’otu aka ahụ ndị ikom na ndị inyom kwesịrị ntụkwasị obi e kwuru okwu ha na Bible, dị ka Abraham, Aịsak, Rehab, na Devid, nwere ezi uche ma dị akọ mgbe ha na ndị pụrụ ịbụ ndị iro ha na-emekọrịta ihe. (Jenesis 20:11-13; 26:9; Joshua 2:1-6; 1 Samuel 21:10-14) Bible na-agụ ndị ikom na ndị inyom dị otú ahụ dị ka ndị ji ikwesị ntụkwasị obi fee ofufe bụ́ ndị e ji nrubeisi mara ná ndụ. Nke ahụ mere ka ha bụrụ ndị kwesịrị nṅomi.—Ndị Rom 15:4; Ndị Hibru 11:8-10, 20, 31, 32-39.

E nwere mgbe ịgha ụgha pụrụ iyi ihe ga-agwọta ihe n’ụzọ dị mfe. Ma ndị Kraịst taa ga-eme nke ọma iṅomi ihe ndị Jisọs mere ma gbasoo akọ na uche ha e ji Bible zụọ karịsịa mgbe ha na-eche ọnọdụ ndị siri ike ihu.—Ndị Hibru 5:14.

Bible na-agba anyị ume ịbụ ndị na-ekwu eziokwu ma na-akwụwa aka ọtọ. Ịgha ụgha ezighị ezi, anyị kwesịkwara irube isi na ndụmọdụ Bible ahụ bụ́: “Na-ekwunụ eziokwu onye ọ bụla n’ebe onye agbata obi ya nọ.” (Ndị Efesọs 4:25) Site n’ime otú ahụ, anyị ga-anọgide na-enwe akọ na uche dị ọcha, kwalite udo na ịhụnanya n’ọgbakọ ma nọgide na-asọpụrụ “Chineke nke eziokwu.”—Abụ Ọma 31:5; Ndị Hibru 13:18.

[Foto dị na peeji nke 16]

Ananaịas na Safaịra nwụrụ n’ihi ịgha ụgha