Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịkpụru Afụ Ọnụ Ala

Ịkpụru Afụ Ọnụ Ala

Ịkpụru Afụ Ọnụ Ala

SITE N’AKA ONYE NTA AKỤKỌ TETA! N’AUSTRALIA

Ọ BỤRỤ na nwoke na-eji minit 5 akpụ afụ ọnụ ya n’otu ụbọchị ma na-eme otú ahụ kwa ụbọchị ruo afọ 50, ọ ga-ejiworị ihe ji ntakịrị ihe karịa ụbọchị 63 nke ndụ ya kpụọ ajị dị ya n’ihu! Olee otú ndị ikom si ele omenala a ha na-eme kwa ụbọchị anya?

Otu nnyocha nkịtị e mere na nso nso a mere ka e nweta ihe ndị a e kwuru banyere ịkpụ afụ ọnụ: “Ọ masịghị m.” “Akpọrọ m ya asị.” “Ọ bụ otu n’ime ihe ndị dị ize ndụ ná ndụ.” “Ihe a ga-ezere mgbe ọ bụla o kwere mee.” Ọ bụrụ na ndị ikom na-ele nnọọ ịkpụ ajị dị ha n’ihu anya ọjọọ, n’ihi gịnị ka ha ji akpụ ya? Ka anyị mụtụkwuo ihe banyere ịkpụ afụ ọnụ. Ikekwe anyị ga-enweta azịza ya.

Site n’Okpokoro Akịrịkọ Gaa n’Agụba Ndị E Ji Eme Ihe Nanị Otu Ugboro

Ị̀ pụrụ iche n’echiche iji okpokoro akịrịkọ akpụ afụ ọnụ? Gịnị banyere iji ezé azụ̀ shark, na ikekwe iji ibé nkume dị nkọ? Ụmụ mmadụ ejiwo ọgụgụ isi dị ịrịba ama mee ihe n’ịhọrọ ihe e ji akpụ afụ ọnụ! N’Ijipt oge ochie ndị ikom jiri agụba ọla yiri isi anyụike kpụọ afụ ọnụ. N’oge na-adịbeghị nnọọ anya, na narị afọ nke 18 nakwa na nke 19, e mepụtara ihe a bịara mara dị ka ihe ndị dị oké nkọ, karịsịa na Sheffield, England. N’ịbụ ndị a na-achọkarị mma nke ukwuu, ihe ndị a e ji akpụ afụ ọnụ na-enwe agụba ígwè ndị na-amịkpu n’isi ya mgbe a na-ejighị ha eme ihe. A ghaghị ijizi nnọọ ihe ndị a ejizi, ihe ịrụ ụka adịghịkwa ya na mmadụ pụrụ imepụ onwe ya ọbara mgbe ọ ka na-amụ iji ha eme ihe. Nye ndị na-enwechaghị nkà, ịmalite iji ha eme ihe aghaghị ịkpatara ha mmerụ ahụ. Otú ọ dị, e nwere mgbanwe na narị afọ nke 20.

Na 1901 otu nwoke na United States aha ya bụ King Camp Gillette mepụtara ihe e ji akpụ afụ ọnu na-adịghị emerụ ahụ nke nwere agụba a na-eji eme ihe nanị otu ugboro. Ihe o chepụtara masịrị ndị mmadụ nke ukwuu ma mesịa kpata imepụta ya n’ụdị dị iche iche, gụnyere ihe ndị e ji akpụ afụ ọnụ bụ́ ndị e ji ọlaọcha ma ọ bụ ọlaedo mee isi ha. Ihe ndị e ji akpụ afụ ọnụ e mepụtara na nso nso a gụnyere ndị e ji eme ihe nanị otu ugboro, ihe ndị e ji akpụ afụ ọnụ bụ́ ndị nwere agụba gbara mkpị ma ọ bụ ndị gbara atọ, na ihe ndị e ji akpụ afọ ọnụ bụ́ ndị nwere isi a pụrụ ịgbanwe agbanwe na ndị a na-ahịọpụta ahịọpụta.

Otú ọ dị, a gaghị echezọ ihe e ji akpụ afụ ọnụ ji ike eletrik arụ ọrụ, bụ́ ndị gbara n’ahịa na nke mbụ ya na 1931. Ha anọgidewo na-adịwanye irè ma na-ewuwanye ewu, ma ihu agụba nke dị nkọ ka na-amasị ọtụtụ ndị chọrọ ịkpụru afụ ọnụ ha ala n’ezie.

Akụkọ Banyere Afụ Ọnụ Na-ewu Ewu ma Na-ala Ala

Malite n’oge gboo ihe a kpọrọ mmadụ ahụwo ka afụ ọnụ wuru ma laa. Ndị Ijipt oge ochie, ka akwụkwọ bụ́ Everyday Life in Ancient Egypt na-ekwu, “abụghị ndị e ji ịgba ajị ahụ mara, ha nwere afọ ojuju ịbụ ndị na-eji agụba ndị a rụrụ nke ọma akpụchasị afụ ọnụ ha, bụ́ ndị ha na-edote n’akpa akpụkpọ anụ dị ọcha.” Omenala a pụrụ ịkọwa ihe mere Josef bụ́ onye Hibru a tụrụ mkpọrọ ji kpụọ afụ ọnụ ya tupu ọ bịa n’ihu Fero.—Jenesis 41:14.

Ndị Asiria bụ agbụrụ nwere ndị ikom afụ ọnụ ha mara mma. Ebe ha na-eji ya akpa nganga, ha na-elekọta ma na-elebara afụ ọnụ ha anya nke ukwuu, na-eme ka ọ hịkọọ ahịkọọ, na-eke ya eke, na-edozikwa ya edozi n’ụzọ dị ukwuu.

Ndị ikom Israel oge ochie na-enwe afụ ọnụ na-etoghị ogologo, ha na-ejikwa agụba akpụdata ya otú dị mma. Ya mere, gịnị ka Iwu Chineke pụtara mgbe ọ gwara ndị ikom Israel ka ha ghara ‘ịkọpụ ụsọ isi ha gburugburu’ ma ọ bụ ‘ibibi ụsọ’ afụ ọnụ ha? Nke a abụghị iwu na-amachibido mmadụ ịkpụtulata isi ma ọ bụ afụ ọnụ ya. Kama, o mere ka ndị ikom Israel ghara iṅomi ihe omume okpukpe gabigara ókè nke mba ndị na-ekpere arụsị ha na ha gbara agbata obi. *Levitikọs 19:27; Jeremaịa 9:25, 26; 25:23; 49:32.

Na Gris oge ochie, mmadụ nile na-ahapụkarị afụ ọnụ ha ma e wezụga ndị a ma ama, bụ́ ndị na-akpụchasịkarị afụ ọnụ ha. Na Rom, ịkpụ afụ ọnụ yiri ka ọ malitere na narị afọ nke abụọ T.O.A., mgbe ọtụtụ narị afọ gasịkwara, ịkpụ afụ ọnụ kwa ụbọchị nọgidere na-abụ ihe a na-emekarị.

Otú ọ dị, mgbe Alaeze Ukwu Rom dara, afụ ọnụ lọghachiri, dịgide ruo 1,000 afọ wee rute n’ọkara nke abụọ nke narị afọ 17, bụ́ mgbe ịkpụ afụ ọnụ ghọrọ ihe na-ewu ewu. Ịkpụchasị afụ ọnụ dịgidere gabiga narị afọ nke 18. Ma, site n’etiti narị afọ nke 19 ruo ná ngwụsị ya, egwú maliteziri ịdaghari. N’ihi ya, foto C. T. Russell, bụ́ onyeisi oche mbụ nke the Watch Tower Society, na onye Kraịst ibe ya bụ́ W. E. Van Amburgh na-egosi na ndị ikom abụọ a nwere afụ ọnụ wuru ewu, a kpụrụ nke ọma bụ́ ndị dị ùgwù ma zie ezie n’oge ha. Otú ọ dị, ná mmalite narị afọ nke 20, ịkpụ afụ ọnụ maliteghachiri iwu ewu, bụ́ nke dịgideworo n’ihe ka n’ọtụtụ mba ruo n’oge anyị.

Ị̀ bụ otu n’ime ọtụtụ nde ndị ikom na-ele anya n’enyo ka ha ji agụba eme omenala ahụ a na-eme kwa ụbọchị? Ọ bụrụ otú ahụ, ihe ịrụ ụka adịghị ya na ị chọrọ ime ka ọ bụrụ nke na-adịghị afụ ụfụ, na-adịghị agba ọbara, na-adịkwa irè ruo ókè ọ pụrụ ikwe mee. Iji mezuo nke ahụ, ọ pụrụ ịmasị gị ịtụle aro ndị dị n’igbe bụ́ “Ihe Ọmụma Maka Iji Agụba Akpụ Afụ Ọnụ.” Ma eleghị anya ị nọworị na-agbaso ụfọdụ n’ime aro ndị a. N’agbanyeghị nke ọ bụ—na-ama ụtọ ịkpụchasị na ịkpụru afụ ọnụ gị ala!

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 12 Lee Insight on the Scriptures, mpịakọta nke 1, peji nke 266 na 1021, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 13]

Ihe Ọmụma Maka Iji Agụba Akpụ Afụ Ọnụ

Akwụkwọ bụ́ Men’s Hair na-atụ aro ndị na-esonụ maka iji agụba akpụ afụ ọnụ n’ụzọ gara nke ọma. *

1. Ime ka ajị ihu gị dị nro: Nanị ụzọ a pụrụ isi mee nnọọ ka ajị ihu dị nro bụ iji nnukwu mmiri ọku saa ha. Ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee, kpụọ afụ ọnụ gị mgbe ị sasịrị ahụ, n’ihi na nke a ga-eme ka mmiri nwee ike ime ka ajị ihu dị nro.

2. Ite ihe ndị e ji akpụ afụ ọnụ: Ụdị ncha, ụfụfụ, na ude dịgasị iche na-arụ ihe atọ bụ́ isi. (1) Ha na-arachigide mmiri n’ime ajị ihu, (2) ha na-eme ka ha kwụrụ ọtọ, (3) ha na-emekwa ka akpụkpọ ahụ ghara isi ike ka agụba wee na-agafe n’elu ya n’ụzọ dị mfe karị. Na-ahọrọ ụdị nke kasị arụ ọrụ otú dị gị mma. Ị̀ nwalewo ude e ji edozi isi? E mekwara ya maka ime ka ntutu dị nro.

3. Iji agụba kwesịrị ekwesị eme ihe n’ụzọ dị mma: Agụba kwesịrị ekwesị bụ agụba dị nkọ. Agụba na-adịghị nkọ pụrụ imebi akpụkpọ ahụ gị. Si n’azụ ajị na-akpụ ya. Isite n’ihu ya pụrụ ime ka ị kpụruo ya ala, ma ọ pụrụ ịkpụbi ajị banye n’ime akpụkpọ ahụ ma mee ka ha tobanye n’ime uru ahụ kama isi n’oghere dị n’akpụkpọ ahụ topụta. Dị ka ụfọdụ ndị si kwuo, àgwà ejighị mkpachara anya akpụ afụ ọnụ—nke ndị ikom na ndị inyom—pụrụ ime ka e bute nje na-eme ka e nwee akpụkpa n’ahụ.

4. Ihe e ji echebe akpụkpọ ahụ mgbe a kpụsịrị afụ ọnụ: Oge ọ bụla ị kpụrụ afụ ọnụ, ị na-akpụpụ elu akpụkpọ ahụ nke anya nkịtị na-apụghị ịhụ, na-eme ka ihe nwee ike imetụta akpụkpọ ahụ gị. N’ihi ya, ọ dị mkpa ka i jiri mmiri dị ọcha sachapụ ihe nile ị kpụpụtara n’ihu gị—i jiri mmiri dị ṅara ṅara sasịa ya, i jirizie nke jụrụ oyi mechie ohere akpụkpọ ahụ ma rachigide mmiri n’ime ya. Ọ bụrụ na ị chọọ, ị pụrụ ite ya ude a na-ete mgbe a kpụsịrị afụ ọnụ iji chebe akpụkpọ ahụ gị ma mee ka ọ dịghachi ọhụrụ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 20 Isiokwu a na-atụle ịkpụ afụ ọnụ maka ndị ikom. N’ọtụtụ mba, ndị inyom na-akpụkwa akụkụ ahụ ha ụfọdụ, n’ihi ya kwa ha pụkwara ịhụ ụfọdụ n’ime ihe ndị a e kwuru okwu ha dị ka ndị na-enye aka.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 14]

Gịnị Bụ Ajị Ihu?

Ajị ihu bụ ajị ndị na-eru n’ihu. Ihe ndị mejupụtara ha bụ keratin na protein ndị yiri ya. Keratin bụ protein nwere sulfur bụ́ nke ahụ mmadụ na anụmanụ na-emepụta, ọ bụkwa ihe bụ́ isi na-emepụta ajị, mbọ, ábụ́bà, ọbọ ụkwụ anụmanụ, na mpi. N’ime ajị nile dị n’ahụ mmadụ, ajị ihu so ná ndị kasị sie ike nakwa ndị kasị erupụtaghachi ngwa ngwa, na-esi ike mgbubi dị ka waya ha na ya hà n’ibu. Ihe ruru 25,000 na-adị n’ihu nwoke ọ bụla, ha na-etorukwa ihe dị ka ọkara milimita kwa awa 24.

[Ebe E Sigasị Nweta Foto]

Ndị ikom: A Pictorial Archive from Nineteenth-Century Sources/ Dover Publications, Inc.

[Foto ndị dị na peeji nke 14]

Akụkọ banyere afụ ọnụ na-ewu ewu ma na-ala ala

Onye Ijipt

Onye Asiria

Onye Rom

[Ebe E Sigasị Nweta Foto]

Museo Egizio di Torino

Foto ndị e sere site n’ikike a natara British Museum