Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọnwụ Ojii—Ihe Otiti Tiri Europe Mgbe Ọ Na-emepechabeghị Anya

Ọnwụ Ojii—Ihe Otiti Tiri Europe Mgbe Ọ Na-emepechabeghị Anya

Ọnwụ Ojii—Ihe Otiti Tiri Europe Mgbe Ọ Na-emepechabeghị Anya

Site n’aka onye nta akụkọ Teta! na France

Afọ ahụ bụ 1347. Ihe otiti ahụ ebibisịworị Ebe Ime Ime Ọwuwa Anyanwụ Ụwa. Ugbu a ọ banyewo n’ókèala ebe ọwụwa anyanwụ Europe.

NDỊ Mongol nọ na-awakpo ebe azụmahịa e wusiri ike nke ndị Genoa dị na Kaffa, bụ́ nke a na-akpọzi Feodosiya, dị na Crimea. N’ịbụ ndị ọrịa ahụ a na-amaghị aha ya gburu ihe ka ọtụtụ n’ime ha, ndị Mongol kwụsịrị mwakpo ha. Ma tupu ha laa, ha gbapụrụ ngwá agha ọjọọ ikpeazụ. N’iji nnukwu ihe e ji agbapụ àkụ́ mee ihe, ha si n’elu mgbidi gbabata ozu ndị ihe otiti ahụ gburu ọhụrụ n’ime obodo ahụ. Mgbe mmadụ ole na ole n’ime ndị agha Genoa mesịrị banye n’ụgbọ mmiri ha iji si n’obodo ahụ nwere ihe otiti gbapụ, ha gbasara ọrịa ahụ n’ọdụ ụgbọ mmiri ọ bụla ha gara.

N’ime ọnwa ole na ole ọtụtụ mmadụ nwụrụ na Europe nile. N’egbughị oge ọ gbasaruru n’Ebe Ugwu Africa, Itali, Spain, England, France, Austria, Hungary, Switzerland, Germany, Scandinavia, na mba ndị dị n’ógbè Baltic. N’ihe ji ntakịrị ihe karịa afọ abụọ, ihe karịrị otu ụzọ n’ụzọ anọ nke ndị nọ na Europe, ihe dị ka nde mmadụ 25, nwụrụ n’ihe a kpọrọ “ọdachi kasị gbuo mmadụ nke ihe a kpọrọ mmadụ hụtụrụla”—Ọnwụ Ojii. *

Idoziri Ọdachi Ala

Ọdachi nke Ọnwụ Ojii gunyere ihe karịrị ọrịa ahụ n’onwe ya. Ọtụtụ ihe tinyere aka mee ka ọdachi a ka njọ, otu n’ime ha bụ ịnụru okpukpe ọkụ n’obi. Ozizi pọgatrị bụ otu ihe atụ. “Ka ọ na-erule ọgwụgwụ narị afọ nke 13, ozizi pọgatrị juru ebe nile,” ka onye France na-akọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Jacques le Goff na-ekwu. Ná mmalite narị afọ nke 14, Dante wepụtara akwụkwọ ya a ma ama bụ́ The Divine Comedy, bụ́ nke kọwara hel na pọgatrị nke ọma. E si otú a nwee ọnọdụ okpukpe bụ́ nke mere ka ndị mmadụ leghara ihe otiti ahụ anya ma ghara iji ya kpọrọ ihe n’ụzọ na-eju anya, na-ele ya anya dị ka ntaramahụhụ sitere n’aka Chineke. Dị ka anyị ga-ahụ, enweghị nchekwube dị otú ahụ mere ka ọrịa ahụ gbasakwuo n’ezie. “Ọ dịghị ihe ọzọ pụwororị ịkwalite mgbasa nke ọrịa ahụ karịa ọnọdụ ahụ,” ka akwụkwọ bụ́ The Black Death, nke Philip Ziegler dere na-ekwu.

Ọzọkwa, a bịaziri nwee nsogbu nke ihe ọkụkụ emeghị nke ọma na Europe ugboro ugboro. N’ihi ya, ọnụ ọgụgụ na-arị elu nke ndị nọ na kọntinent ahụ erighị ihe ndị na-edozi ahụ—na-eme ka ha ghara iguzogideli ọrịa.

Ihe Otiti ahụ Agbasaa

Dị ka dibịa na-elekọta ahụ ike Popu Clement nke Isii, bụ́ Guy de Chauliac, si kwuo, ụdị ihe otiti abụọ wakporo Europe: oyi ịba n’ahụ na etuto. Ọ kọwara ọrịa ndị a nke ọma mgbe o dere, sị: “Nke mbụ dịruru ọnwa abụọ, na-eme ka mmadụ nwee ahụ ọkụ n’esepụghị aka ma na-agbọ ọbara, nke a na-egbukwa onye na-arịa ya n’ime ụbọchị atọ. Nke abụọ dịgidere ruo oge ahụ nile, o na-emekwa ka mmadụ nwee ahụ ọkụ n’esepụghị aka ma too onye ahụ etuto n’ahụ, karịsịa ná mkpaabụ na n’akụkụ ehe. Nke a na-egbu onye ahụ na-arịa ya n’ime ụbọchị ise.” Ndị dọkita amaghị ihe ha ga-eme iji kwụsị ihe otiti ahụ.

Ọtụtụ mmadụ ji ụjọ gbapụ—hapụ ọtụtụ puku ndị butere ọrịa ahụ. N’ezie, ndị ọgaranya a maara aha ha na ndị ọkachamara so ná ndị mbụ gbapụrụnụ. Ọ bụ ezie na ndị ụkọchukwu ụfọdụ gbapụkwara, ọtụtụ ndị ụkọchukwu zoro n’ebe obibi ha, na-enwe olileanya na ọrịa ahụ agaghị efe ha.

Ka a nọ n’ọgba aghara a, popu kwuru na 1350 bụ Afọ Dị Nsọ. A ga-eme ka ndị njem ala nsọ gara Rome banye na paradaịs n’ebughị ụzọ gaa pọgatrị! Ọtụtụ narị puku ndị njem ala nsọ zara òkù ahụ—na-agbasa ihe otiti ahụ ka ha na-aga.

Mgbalị Ndị Kụrụ Afọ n’Ala

Mgbalị ndị e mere iji chịkwaa Ọnwụ Ojii kụrụ afọ n’ala n’ihi na ọ dịghi onye maara n’ezie otú e si ebufe ya. Ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ ghọtara na imetụ onye na-arịa ya ma ọ bụ ọbụna ákwà ya aka—dị ize ndụ. Ụfọdụ tụrụ ọbụna anya onye na-arịa ya na-ele ha egwu! Otú ọ dị, ndị bi na Florence, Itali, kwuru na ọ bụ nwamba na nkịta ha kpatara ihe otiti ahụ. Ha gburu anụmanụ ndị a, n’amaghị na site n’ime otú ahụ, ha nyere anụmanụ na-ekesa ọrịa ahụ n’ezie ohere—òké.

Ka ndị mmadụ na-anwụ n’ike n’ike, ụfọdụ chigharịkwuuru Chineke maka enyemaka. Ndị ikom na ndị inyom nyere chọọchị ihe nile ha nwere, na-enwe olileanya na Chineke ga-echebe ha pụọ n’ọrịa—ma ọ bụ ma ọ dịghị ihe ọzọ jiri ịdị ndụ n’eluigwe kwụghachi ha ụgwọ ma ọ bụrụ na ha anwụọ. Nke a mere ka chọọchị nwee akụ̀ na ụba nke ukwuu. Ọtụtụ ndị jikwa ọgwụ isi ọma, onyinyo Kraịst, na ọgwụ nchebe mere ihe mgbochi. Ndị ọzọ chigharịkwuuru nkwenkwe ụgha, majik na ihe ndị na-abụghị ọgwu n’ezie maka ọgwụgwọ. E kwuru na ihe ndị na-esi ísì ụtọ, mmanya gbara ụka, na mmiri ọgwụ ndị pụru iche na-agwọ ọrịa ahụ. Ịmịpụ ọbara n’ahụ bụ ọgwụgwọ ọzọ ọtụtụ ndị mmadụ jiri mee ihe. Ọbụnadị ngalaba na-akụzi ịgwọ ọrịa nke Mahadum Paris a ma ama kwuru na ihe kpatara ihe otiti ahụ bụ nnọzigharị nke mbara ụwa! Otú ọ dị, nkọwa na “ọgwụgwọ” adịgboroja emeghị ihe ọ bụla iji mee ka ihe otiti ahụ na-egbu mmadụ kwụsị.

Mmetụta Ndị Na-adịgide Adịgide

N’ime afọ ise Ọnwụ Ojii ahụ mesịrị yie ka ọ kwụsịwo. Ma tupu ọgwụgwụ narị afọ ahụ, ọ lọghachiri ugboro anọ ma ọ dịkarịa ala. Ya mere e jiriwo ihe ndị Ọnwụ Ojii kpatara tụnyere ihe ndị Agha Ụwa Mbụ kpatara. “Ọ fọrọ nke nta ka ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme nke oge a kwekọrịtachaa na ọbịbịa nke ihe otiti ahụ zuru ebe nile metụtara akụ̀ na ụba na ọha mmadụ n’ụzọ dị ukwuu mgbe 1348 gasịri,” ka akwụkwọ e bipụtara na 1996 bụ́ The Black Death in England na-ekwu. Ihe otiti ahụ gburu ọtụtụ mmadụ, ọtụtụ narị afọ gafekwara tupu ebe ụfọdụ amaliteghachi inwe ọtụtụ mmadụ. N’ihi mbeleta nke ndị ọrụ, dị ka a pụrụ ịtụ anya ya, ụgwọ a na-akwụ ndị ọrụ rịrị elu. Ndị bụbu aka ji akụ̀ nwere ala dara ogbenye, usoro nke ala ịdị n’aka ndị ọgaranya—ihe e ji mara Mgbe Ụwa Na-emepechabeghị Anya—ghasasịrị.

Ya mere, ihe otiti ahụ bụ ihe nyere aka mee ka e nwee mgbanwe nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị, okpukpe, na nke mmekọrịta ọha mmadụ. Tupu e nwee ihe otiti ahụ, asụsụ French bụ ihe ndị gụrụ akwụkwọ n’England na-asụkarị. Otú ọ dị, ọnwụ nke ọtụtụ ndị na-akụzi asụsụ French mere ka ndị na-asụ asụsụ Bekee karịa ndị na-asụ asụsụ French na Britain. E nwekwara mgbanwe n’ihe ndị metụtara okpukpe. Dị ka onye France na-akọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Jacqueline Brossolle na-ekwu, n’ihi enweghị ọtụtụ ndị chọrọ ịbụ ndị ụkọchukwu, “mgbe mgbe Chọọchị chiri ndị na-enweghị ihe ha ma, na-enweghịkwa mmasị ịbụ ndị ụkọchukwu echichi.” Brossollet na-ekwu na “mbibi nke ebe mmụta na nke okwukwe nke [chọọchị] bụ otu n’ime ihe mere e ji nwee Mgbanwe.”

N’ezie Ọnwụ Ojii ahụ metụtara nkà ihe osise n’ụzọ dị ukwuu, nke mere ka ọnwụ bụrụ ihe a na-esekarị n’ihe osise. Otu udị egwú ọnwụ a ma ama, bụ́ nke a na-egosikarị ọkpụkpụ na ozu na ya, ghọrọ ihe nnọchianya nke na-egosi ike nke ọnwụ. N’ịbụ ndị na-amaghị ihe ọdịnihu ga-abụ, ọtụtụ ndị ihe otiti ahụ na-egbughị meweziri ihe otú o si masị ha. Omume ọma si otú a ghọọ ihe na-adịghịkwa adị. Banyere chọọchị, ebe ọ bụ na o gbochighị Ọnwụ Ojii ahụ, “onye biri ndụ mgbe ụwa na-emepechabeghị anya chere na Chọọchị ya emeghị ihe ọ tụrụ anya ya.” (The Black Death) Ụfọdụ ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme na-ekwukwa na mgbanwe ndị e nwere ná mmekọrịta ọha mmadụ mgbe Ọnwụ Ojii ahụ kwụsịrị kwalitere omume nke mmadụ ime ihe n’onwe ya na ịdị uchu ma mee ka e nwekwuo mgbanwe ná mmekọrịta ọha mmadụ na akụ̀ na ụba—ihe ndị dugara n’usoro nke akụ̀ na ụba ịdị n’aka ndị nkịtị.

Ọnwụ Ojii ahụ kpalikwara gọọmenti iguzobe usoro dị iche iche maka idebe ihe ọcha. Mgbe ihe otiti ahụ kwụsịtụrụ, Venice mere ihe iji debe okporo ámá ndị dị na ya ọcha. Eze John nke Abụo nke France, bụ́ onye a na-akpọ Onye Ọma, nyekwara iwu mkpocha okporo ámá dị ka ụzọ isi gbochie iyi egwu nke ntịwapụ nke ọrịa. Eze ahụ mere nke a mgbe ọ matasịrị banyere otu dọkịta Gris oge ochie bụ́ onye zọpụtara Atens n’aka otu ihe otiti site n’ịzacha na ịsacha okporo ámá. E mesịrị debe ọtụtụ okporo ámá ndị e nwere mgbe ụwa na-emepechabeghị anya ọcha, bụ́ ndị bụbu nnọọ olulu mmiri nsị ndị ghe oghe.

Ọ̀ Bụ Ihe Mgbe Ochie?

Otú ọ dị, ọ bụ mgbe o ruru 1894, ka onye France bụ́ ọkà n’ihe banyere nje bụ́ Alexandre Yersin chọpụtara nje kpatara Ọnwụ Ojii ahụ. A kpọrọ ya Yersinia pestis, iji na-echeta aha ya. Mgbe afọ anọ gasịrị, onye France ọzọ, bụ́ Paul-Louis Simond, chọpụtara ọrụ akpịrị (na-adị n’ahụ òké) rụrụ n’ibufe ọrịa ahụ. N’oge na-adịghị anya e mepụtara ọgwu mgbochi ọrịa nke na-enwechaghị ihe ịga nke ọma.

Ihe otiti ahụ ọ̀ bụ ihe mgbe ochie? Ọ dịghị ma ọlị. N’oge oyi nke 1910, ihe otiti ahụ gburu ihe dị ka mmadụ 50,000 na Manchuria. Kwa afọ kwa Òtù Ahụ Ike Ụwa na-agụta ọtụtụ puku ndị ọzọ rịara ya—ọnụ ọgụgụ ahụ na-arịwanye elu. A chọpụtawokwa na e nwere ụdị ọhụrụ nke ọrịa ahụ—ụdị na-esi ike ọgwụgwọ. Ee, ọ gwụla ma a gbasoro ụkpụrụ ịdị ọcha ndị bụ́ isi, ihe otiti ahụ ka bụ ihe iyi egwu nye ihe a kpọrọ mmadụ. Ya mere akwụkwọ bụ́ Pourquoi la peste? Le rat, la puce et le bubon (Gịnị Kpatara Ihe Otiti ahụ? Òké ahụ, Akpịrị ahụ, na Etuto ahụ), bụ́ nke Jacqueline Brossollet na Henri Mollaret dere, kwubiri na “kama ịbụ ọrịa nke Europe oge ochie nke Mgbe Ụwa Na-emepechabeghị Anya, . . . ọ dị mwute ikwu na ikekwe ihe otiti ahụ bụ ọrịa nke ọdịnihu.”

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Ndị biri ndụ n’oge ahụ kpọrọ ya oké ọrịa na-efe efe ma ọ bụ ntiwapụ nke ọrịa.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 19]

Ndị ikom na ndị inyom nyere chọọchị ihe nile ha nwere, na-enwe olileanya na Chineke ga-echebe ha pụọ n’ọrịa

Box/Picture on peeji 20]

Òtù Ndị Na-apịa Onwe Ha Ụtarị

N’ile ihe otiti ahụ anya dị ka ntaramahụhụ sitere n’aka Chineke, ụfọdụ ndị chọrọ ime ka iwe Chineke dajụọ site n’ịpịa onwe ha ụtarị. Òtù Ụmụnna nke Ndị Na-apịa Onwe Ha Ụtarị, bụ́ òtù e kwuru na ha ruru ihe dị ka 800,000, wuru ewu karịsịa n’oge ahụ e nwere Ọnwụ Ojii. Iwu òtù ahụ machibidoro ịgwa ndị inyom okwu, ịsa, ma ọ bụ ịgbanwe ákwà. Ha na-apịa onwe ha ụtarị n’ihu ọha ugboro abụọ n’ụbọchị.

“Mmadụ ịpịa onwe ya ụtarị bụ otu n’ime ụzọ ole na ole ndị egwu na-atụ si mee ka obi ha dajụọ,” ka akwụkwọ bụ́ Medieval Heresy na-ekwu. Ndị ahụ na-apịa onwe ha ụtarị pụtakwara ìhè n’ịkatọ ndị ndú chọọchị nakwa n’ịgba omume chọọchị ahụ nke ịgbaghara ndị mmadụ mmehie bụ́ nke na-enye ha nnukwu ego mgba okpuru. Ka a sịkwa ihe mere popu ji katọọ òtù ahụ na 1349. Otú ọ dị, n’ikpeazụ, òtù ahụ ji aka ya dakpọọ mgbe Ọnwụ Ojii ahụ kwụsịrị.

[Foto]

Ndị na-apịa onwe ha ụtarị chọrọ ime ka iwe Chineke dajụọ

[Ebe E Si Nweta Foto]

© Bibliothèque Royale de Belgique, Bruxelles

[Foto dị na peeji nke 21]

Ihe otiti ahụ na Marseilles, France

[Ebe E Si Nweta Foto]

© Cliché Bibliothèque Nationale de France, Paris

[Foto dị na peeji nke 21]

Alexandre Yersin chọpụtara nje na-akpata ihe otiti ahụ

[Ebe E Si Nweta Foto]

Foto Ndị Culver Sere